ILU 6:1-5
ILU 6:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe, ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe, ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya. Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla. Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra. Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya.
ILU 6:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Nwam, ọ buru na i nọworo madu-ibe-gi na mbe, Ọ buru na i narawo onye ala ọzọ n'aka ibu onye-mbe, Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n'ọnyà, Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi. Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi, N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi; Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti. Enyela anya-gi abua ura, Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura. Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá, Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà.