ILU 6:1-11
ILU 6:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe, ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe, ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya. Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla. Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra. Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya. Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile. Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha, ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi. Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie? Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike, ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
ILU 6:1-11 Bible Nso (IGBOB)
Nwam, ọ buru na i nọworo madu-ibe-gi na mbe, Ọ buru na i narawo onye ala ọzọ n'aka ibu onye-mbe, Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n'ọnyà, Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi. Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi, N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi; Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti. Enyela anya-gi abua ura, Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura. Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá, Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà. Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe: Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi, Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku, Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi. Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu? Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie? Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala; Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe, Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.