Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 4:2-26

ILU 4:2-26 Bible Nso (IGBOB)

N'ihi na ezi ihe-nmuta ka m'nyeworo unu; Unu arapula iwum. N'ihi na nwa ka m'buru nnam, Di nrò, buru kwa nwa enwere nání ya n'iru nnem. O we zím ihe, sim, Ka obi-gi jide okwum nile; Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu: Nweta amam-ihe, nweta nghọta; Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi: Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi; Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi. Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta. Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi: Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi. Ọ gēnye isi-gi okpu amara: Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n'aka. Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile; Arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba. N'uzọ amam-ihe ka m'zíworo gi ihe; Emewom ka i zọ ije n'uzọ nile nke izi-ezi. Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi; Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ. Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka: Chebe ya; n'ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi. Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ. Zere ya, agabigala nime ya; Wezugara ya onwe-gi, gabiga. N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ; Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ. N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu, Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu. Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara. Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri: Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ. Nwam, ṅa nti n'okwum nile; Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile. Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Debe ha n'etiti obi-gi. N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha, Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile. Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di. Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ. Ka anya-gi abua legide n'iru, Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n'iru gi. Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari, Ka edozi kwa uzọ-gi nile.

ILU 4:2-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m. Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji, ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ. Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị. Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị. Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta. Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ. Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.” Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo. M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi. Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ. Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke. Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha. Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ, nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya. Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara. Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị. Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ. Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma. Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị, nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ. Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile. Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta; kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị. Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu; atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla. Leruo ije ụkwụ gị anya, doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.