ILU 4:14-19
ILU 4:14-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha. Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ, nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya. Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara. Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị. Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.
ILU 4:14-19 Bible Nso (IGBOB)
Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ. Zere ya, agabigala nime ya; Wezugara ya onwe-gi, gabiga. N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ; Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ. N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu, Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu. Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara. Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri: Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.