ILU 4:1-9
ILU 4:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu, lezienụ anya ka unu nwee nghọta. Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m. Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji, ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ. Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị. Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị. Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta. Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ. Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”
ILU 4:1-9 Bible Nso (IGBOB)
Umum, nurunu idọ-aka-na-ntí nke nna, Tọ-kwa-nu nti n'ala ima nghọta: N'ihi na ezi ihe-nmuta ka m'nyeworo unu; Unu arapula iwum. N'ihi na nwa ka m'buru nnam, Di nrò, buru kwa nwa enwere nání ya n'iru nnem. O we zím ihe, sim, Ka obi-gi jide okwum nile; Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu: Nweta amam-ihe, nweta nghọta; Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi: Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi; Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi. Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta. Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi: Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi. Ọ gēnye isi-gi okpu amara: Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n'aka.