ILU 30:24-28
ILU 30:24-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa, ma ha maa ihe nke ukwuu. Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi. Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike, ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume. Igurube enweghị eze, ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị. Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.
Kesaa
Gụọ ILU 30ILU 30:24-28 Bible Nso (IGBOB)
Ihe anọ di nke di ntà n'elu-uwa, Ma ihe ahu mara ihe nke-uku: Danda bu ndi nādighi ike, Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku; Coney bu ndi nēnweghi ume, Ma ha nēdo ulo-ha na nkume di elu; Ọ dighi eze igurube nwere, Ma mb͕e ha nāpu ha nēkè onwe-ha n'usu, ha nile; Nche-ulo nēji aka-ya nile agigado, Ma ihe ahu di n'ulo uku eze.
Kesaa
Gụọ ILU 30