ILU 30:15-16
ILU 30:15-16 Bible Nso (IGBOB)
Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye. Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju, E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo: Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà; Na ala afọ miri nējughi; Na ọku nke nāsighi, O b͕owo.
Kesaa
Gụọ ILU 30ILU 30:15-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Etu nwere ụmụ nwanyị abụọ ndị na-eti, ‘Nye, nye.’ “Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju. E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’ Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’
Kesaa
Gụọ ILU 30