ILU 30:1-4
ILU 30:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya. Ihe nke si n'ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal. N'ezie anu-ọhia ka m'bu kari onye ọ bula, Ọ dighi kwa nghọta madu m'nwere Amutaghkwam amam-ihe, Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara. Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?
ILU 30:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa, Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal: “Ike agwụla m, Chineke ma a pụrụ imeri. Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla; Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe. Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ. Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa? Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya? Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya? Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ? Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya? Gịnịkwa bụ aha nwa ya?