ILU 29:15-27
ILU 29:15-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa, ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere. Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị, ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha. Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị. Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro, ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị, nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ. Olileanya dịrị onye nzuzu karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu. Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi, ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị. Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ, onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie. Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa, ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ. Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha, a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe. Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya, ma onye ọbụla na-atụkwasị ONYENWE ANYị obi na-anọ nʼudo. Ị chọrọ ikpe ziri ezi? Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa ONYENWE ANYị maka ya. Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị; ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.
ILU 29:15-27 Bible Nso (IGBOB)
Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya. Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari: Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha. Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike; E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ. Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta: Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma. Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti: N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza. Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu. Onye zutọworo orù-ya site na nwata, N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa. Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne. Npako madu gēme ka ọ di ala: Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike. Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì: Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula. Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu. Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi: Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia. Ihe-árú n'anya ndi ezi omume ka onye ajọ omume bu: Ọzọ, ihe-árú n'anya onye nēmebi iwu ka onye ziri ezi n'uzọ-ya bu.