ILU 29:1-14
ILU 29:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ, nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ. Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ, ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị. Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi. Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi. Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya. Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama. Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ. Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi. Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile, ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị. Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị. Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị, ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi. Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ. Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume. Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a: ọ bụ ONYENWE ANYị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ. Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe, a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
ILU 29:1-14 Bible Nso (IGBOB)
Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike, N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di. Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri: Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume. Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria: Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì. Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo: Ma onye nānara onyinye nākwada ya. Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọ Nāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u. Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di: Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa. Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike: Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma. Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo: Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu. Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe, Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa. Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì: Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya. Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè: Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua. Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha, Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu. Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo: Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova. Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi, Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.