ILU 2:6-15
ILU 2:6-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na ọ bụ ONYENWE ANYị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa. Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke. Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso. Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile. Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ. Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche. Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ, ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị, ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ. Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ.
ILU 2:6-15 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa: O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe, Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere; Iche okporo-uzọ nile nke ikpé, Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe. Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé, Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula. N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi, Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ; Ìzùzù ganēche gi nche, Nghọta gēchebe gi: Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ, N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu; Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi, Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri; Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ, Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ; Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ, Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha