ILU 2:2-6
ILU 2:2-6 Bible Nso (IGBOB)
Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala, We wezuga obi-gi inwe nghọta; E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku, Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi; Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha, Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya: Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova, Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta. N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa
ILU 2:2-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta. E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị, ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo, mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu ONYENWE ANYị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke. Nʼihi na ọ bụ ONYENWE ANYị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.