ILU 2:16-22
ILU 2:16-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu. Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke. Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ. Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ. Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume, nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.
ILU 2:16-22 Bible Nso (IGBOB)
Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi, N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ; Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ, Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya: N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu, Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu. Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata, Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu: Ka i we je ije n'uzọ ndi di nma, Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume. N'ihi na ndi ziri ezi gēbi n'uwa, Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya. Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n'uwa, Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.