Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 14:1-18

ILU 14:1-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya. Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu ONYENWE ANYị; ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị. Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha. Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ. Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla. Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ. Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị, nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya. Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga, ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ. Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo; ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi. Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya. A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ. Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha, ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya. Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje. Onye mara ihe na-atụ egwu ONYENWE ANYị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ, ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị. Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ, ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma.

ILU 14:1-18 Bible Nso (IGBOB)

Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya: Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya. Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova: Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya. N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di: Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha. Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha: Ma ihe-omume riri nne nēsite n'ike ehi. Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha: Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume. Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya: Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe. Je na ncherita-iru onye-nzuzu, I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya. Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ. Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha: Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di. Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya. Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu: Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku. Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu. Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u; Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú. Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi: Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu. Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula: Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya. Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi. Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì. Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi.