ILU 1:7-9
ILU 1:7-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ịtụ egwu ONYENWE ANYị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị. Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị. Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
Kesaa
Gụọ ILU 1