ILU 1:29-33
ILU 1:29-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị, unu atụghị egwu ONYENWE ANYị. Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m. Unu lelịrị ịba mba m anya. Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta. Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ. Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha, ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi. Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi. Ọ ga-anọ jụụ na-enweghị ihe ọbụla ga-atụ ya egwu.”
ILU 1:29-33 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì, Na n'ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara: Ha achọghi ndum-ọdum; Ha lelìri iba-nbam nile: Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha, Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ. N'ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha, Ọ bu kwa inọ-n'udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n'iyì. Ma onye nēgem nti gēbi na ntukwasi-obi, Ọ gānọ kwa jū nātughi oké egwu ihe ọjọ.