ILU 1:24-28
ILU 1:24-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị, ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu, ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo. Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya. “Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
ILU 1:24-28 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na akpọwom òkù, unu we ju; Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti; Unu we wezuga ndum-ọdum nile, Unu achọghi kwa iba-nbam: Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m'gāchì ọchì; M'gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia; Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike, Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe; Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu. Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m'gaghi-aza; Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam