ILU 1:1-7
ILU 1:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel. Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka, maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma, nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị. Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma. Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ. Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile na-esi nʼọnụ ndị maara ihe. Ịtụ egwu ONYENWE ANYị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
ILU 1:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel: Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti; Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta; Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche, Na ezi omume na ikpé na izi-ezi; Inye ndi nēnweghi uche ezi uche, Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù: Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya; Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu: Ighọta ilu, na okwu miri emi; Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha. Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma: Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya.