NDI FILIPAI 4:11-13
NDI FILIPAI 4:11-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla. Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
NDI FILIPAI 4:11-13 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bughi na anamekwu okwu bayere nkpà: n'ihi na mu onwem mutara, n'ọnọdu ọ bula m'nọ, inwezu nime ya ihe nile nākpam nkpà. Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n'ihe ọ bula na n'ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n'afọ-ojuju na inọ kwa n'agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà. Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.