NDI FILIPAI 4:1-23
NDI FILIPAI 4:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nʼanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ okpueze m nʼihi ọrụ m na-arụ, bikonu, guzosienụ ike nʼime Onyenwe anyị. Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị. E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ. Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ! Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke. Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs. Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya. Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu. Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya. Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla. Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike. Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya. Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu. Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m. Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye unu, kama ana m achọ ka mkpụrụ unu ga-amịta baa ụba, bara unu uru. Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma. Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs. Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. Keleere m ndị nsọ niile nʼime Kraịst Jisọs. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu. Ndị nsọ niile nọ nʼebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nʼụlọ Siza. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
NDI FILIPAI 4:1-23 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya ndi agu unu nāgusikwam ike, ọṅùm na okpu-ezem, guzosienu ike otú a nime Onye-nwe-ayi, ndi m'huru n'anya. Ariọm Yuodia, ariọkwam Sintiki, ka ha tukwasi uche n'otù ihe ahu nime Onye-nwe-ayi. E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n'ezie n'ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n'ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n'ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n'akwukwọ nke ndu. Nāṅurinu ọṅu n'Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m'gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu. Menu ka madu nile mara obi-ọma-unu. Onye-nwe-ayi nọ nso. Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ. Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus. Nke fọduru, umu-nnam, ka ihe bu ezi-okwu ra, ka ha ra, bú ihe kwesiri nsọpuru, ka ha ra, bú ihe ziri ezi, ka ha ra, bú ihe di ọcha, ka ha ra, bú ihe kwesiri ihu-n'anya, ka ha ra, bú ihe ekwuru nke-ọma; ọ buru na idi-nma ọ bula di, o buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia. Ihe unu matara, nke unu nata-kwara, nke unu nu-kwa-ra, nke unu hu-kwa-ra n'arum, nēmenu ihe ndia: Chineke nke udo gānọyere kwa unu. Ma aṅuri rim ọṅu nke-uku nime Onye-nwe-ayi, na ub͕u a n'oge a unu malitere ọhu itukwasi uche n'ihe bayerem; nke unu nātukwasiri uche-unu nime ya n'ezie, ma unu enweghi oghere. Ọ bughi na anamekwu okwu bayere nkpà: n'ihi na mu onwem mutara, n'ọnọdu ọ bula m'nọ, inwezu nime ya ihe nile nākpam nkpà. Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n'ihe ọ bula na n'ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n'afọ-ojuju na inọ kwa n'agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà. Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike. Otú ọ di, unu mere nke-ọma, n'isom nwekọ nkpab͕um. Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m'siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n'okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu; n'ihi na ọbuná na Tesalọnaika unu zigara otù mb͕e ziga kwa mb͕e ọzọ ib͕om nkpà. Ọ bughi na anamachọ onyinye ahu; kama anamachọ nkpuru ahu nke nāba uba iguyere unu. Ma enwezuwom ihe nile, anamababiga kwa ókè: emewo ka m'zue ezù, ebe m'natara n'aka Epafrọdaitọs ihe nile si n'aka-unu bia, isisì nke ihe ísì utọ, àjà nke anānara nke-ọma, nke nātọ Chineke ezi utọ. Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n'ebube si di, nime Kraist Jisus. Ma otuto diri Chineke-ayi, bú Nna-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. Kelenu onye nsọ ọ bula nime Kraist Jisus. Umu-nna-ayi ndi mu na ha nọ nēkele unu. Ndi nsọ nile nēkele unu, ma ndi nke èzí-na-ulo Sisa kachasi n'ikele unu. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere mọ-unu.