NDI FILIPAI 3:7-10
NDI FILIPAI 3:7-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst. E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru. Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe. Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ.
NDI FILIPAI 3:7-10 Bible Nso (IGBOB)
Otú ọ di, ihe ọ bula nke baram urù, ihe ndia ka m'guru n'ihe-iyì n'ihi Kraist-ayi. E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù, ewe hum nime Ya, nēnweghi ezi omume ọ bula nke akam, bú nke sitere n'iwu, kama nēnwe ezi omume ahu nke okwukwe ekwere na Kraist nēweta, bú ezi omume ahu nke sitere na Chineke n'elu okwukwe: ka m'we mara Ya, na ike nke nbilite-n'ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n'ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n'ọnwu-Ya