NDI FILIPAI 3:5-8
NDI FILIPAI 3:5-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii; igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke. Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst. E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.
NDI FILIPAI 3:5-8 Bible Nso (IGBOB)
ebìrim úgwù n'ubọchi nke-asatọ, esiterem n'umu Israel, site kwa n'ebo Benjamin, abum onye-Hibru nke sitere na ndi-Hibru; n'akuku iwu, abumri onye-Farisi; n'akuku inu-ọku-n'obi, anamesob͕uri nzukọ Kraist; n'akuku ezi omume nke di nime iwu, ahuru na adighi m ita uta. Otú ọ di, ihe ọ bula nke baram urù, ihe ndia ka m'guru n'ihe-iyì n'ihi Kraist-ayi. E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù