Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI FILIPAI 3:4-14

NDI FILIPAI 3:4-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ: e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii; igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke. Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst. E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru. Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe. Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ. Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ. Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya. Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu. Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.

NDI FILIPAI 3:4-14 Bible Nso (IGBOB)

ọ bu ezie na mu onwem puru itukwasi obi ọbuná n'anu aru: ọ buru na onye ọ bula ọzọ nēchè na ya puru itukwasi obi n'anu-aru, mu onwem puru itukwasi obi n'anu-aru kari: ebìrim úgwù n'ubọchi nke-asatọ, esiterem n'umu Israel, site kwa n'ebo Benjamin, abum onye-Hibru nke sitere na ndi-Hibru; n'akuku iwu, abumri onye-Farisi; n'akuku inu-ọku-n'obi, anamesob͕uri nzukọ Kraist; n'akuku ezi omume nke di nime iwu, ahuru na adighi m ita uta. Otú ọ di, ihe ọ bula nke baram urù, ihe ndia ka m'guru n'ihe-iyì n'ihi Kraist-ayi. E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù, ewe hum nime Ya, nēnweghi ezi omume ọ bula nke akam, bú nke sitere n'iwu, kama nēnwe ezi omume ahu nke okwukwe ekwere na Kraist nēweta, bú ezi omume ahu nke sitere na Chineke n'elu okwukwe: ka m'we mara Ya, na ike nke nbilite-n'ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n'ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n'ọnwu-Ya; ọ buru na uzọ ọ bula di m'gēsi ru isi na ndi nwuru anwu bilite. Ọ bughi na anataram ya-ri, ma-ọbu na emewom ka m'zue okè ub͕u a: ma anamab͕aso, ka m'we jide, ma ọ buru na ọ gēkwem, ihe ahu nke Kraist Jisus jide-kwa-ram n'ihi ya. Umu-nnam, mu onwem agughi onwem na ejidewom rue ub͕u a: ma otù ihe ka m'nēme, ebe m'nēchezọ ihe nile di n'azu, nēsetipu kwa aka n'ebe ihe nile di n'iru di, anamab͕akuru ókè ib͕a-ọsọ ka m'we nata ihe anāb͕ata n'ọsọ nke ọkpukpọ di elu nke Chineke nime Kraist Jisus.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara