Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI FILIPAI 2:19-30

NDI FILIPAI 2:19-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Enwere m olileanya nʼime Onyenwe anyị Jisọs na m ga-ezitere unu Timoti nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, ka m site nʼozi ọ ga-anata banyere unu nwee obi ụtọ. Enweghị m onye ọzọ dị ka ya, onye ga-eche ezi echiche maka ọdịmma unu. Nʼihi na ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ọdịmma nke ha, ma ọ bụghị maka ọdịmma Jisọs Kraịst. Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma. Enwere m olileanya nʼezie izitere unu ya. M ga-emekwa nke a ma ọ bụrụ na m chọpụta ihe ọnọdụ m nʼebe a ga-abụ. Nʼezie, enwere m olileanya na site nʼinyeaka Onyenwe anyị, mụ onwe m ga-abịakwutekwa unu na mgbe na-adịghị anya. Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs, nwanna m na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, onye mụ na ya na-ebukọ agha, onyeozi nke unu zitere ka ọ bịa nyere m aka nʼọnọdụ mkpa m. Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nʼihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nʼoge gara aga. Nʼezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nʼọrịa ahụ daa nʼụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara m ebere, nʼihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m ihe mwute nʼelu ihe mwute. Nʼihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nʼobi izite ya nʼebe unu nọ. Nʼihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe. Ya mere, arịọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nʼime Onyenwe anyị, na-asọpụkwaranụ ndị dị ka ya. Nʼihi na ọ fọdụrụ nwantịị ka o nwụọ, nʼihi ọrụ nke Kraịst, tinye ndụ ya nʼihe egwu iji mezuo ọrụ unu nʼebe m nọ.

NDI FILIPAI 2:19-30 Bible Nso (IGBOB)

Ma anamele anya nime Onye-nwe-ayi Jisus na m'gēzigara unu Timọti ọsọsọ, ka mu onwem we nwe kwa obi-utọ, mb͕e m'mara ọnọdu-unu. N'ihi na enweghi m onye ọ bula nke nkpuru-obi-ya yiri nke ya, bú onye gēcheb͕u onwe-ya bayere ọnọdu-unu n'ezie. N'ihi na ha nile nāchọ ihe nke aka ha, ọ bughi ihe nke Jisus Kraist, Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma. Ya mere, onye a ka m'nēle anya na m'gēziga ya n'otù oge ahu, mb͕e ọ bula m'gāhu otú ọ gādirim: ma anamatukwasi obim nime Onye-nwe-ayi na mu onwem gābia kwa ọsọsọ. Ma anamagu ya ihe di nkpà izigara unu Epafrọdaitọs, bú nwa nna m na onye mu na ya nālukọ ọlu, onye mu na ya nēbukọ kwa agha, onye buru kwa onye-ozi-unu na onye nēfè òfùfè ib͕o nkpàm; ebe agu unu nile nāgusi ya ike, obi lọ-kwa-ra ya miri, n'ihi na unu nuru na aru-ya adighi ike: n'ihi na aru-ya adighi ike n'ezie, ọ nọ kwa nso ọnwu: ma Chineke mere ya ebere; ma ọ bughi nání ya onwe-ya, kama mu onwem kwa, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta n'elu ihe-nwuta. Ya mere ọ nānukarim ọku n'obi iziga ya, ka ọ gābu, mb͕e unu huru ya ọzọ, ka unu we ṅuria ọṅu, ka mu onwem we nwe kwa ihe-nwuta nke dikariri ntà. Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a: n'ihi na ọ bu n'ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n'ifè-òfùfè-unu n'ebe m'nọ.