NDI FILIPAI 1:1-13
NDI FILIPAI 1:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs, Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu. Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ. Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a. Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs. Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ. Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs. Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile. Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst. Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto. Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu. Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ.
NDI FILIPAI 1:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Pọl na Timọti, ndi-orù nke Kraist Jisus, nēdegara ndi nsọ nile nime Kraist Jisus ndi nọ na Filipai akwukwọ, ha na ndi nēlekọta unu anya na ndi nējere unu ozi: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. Anamekele Chinekem na ncheta nile m'nēcheta unu, mb͕e nile n'aririọ nile m'nāriọrọ unu nile nāriọ aririọ ahu nime ọṅù, n'ihi nnwekọ unu nwekọrọ n'izisa ozi ọma site n'ubọchi mbu rue ub͕u a; ebe m'tukwasiworo obim n'otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist: dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike. N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus. Nka ka m'nēkpe kwa ekpere, ka ihu-n'anya-unu we nābabiga kwa ókè kari nke-uku nime nmazu na nghọta nile; ka unu we nwa ihe ha na ibe-ha di iche; ka unu we di ọcha n'obi ghara kwa isu ngọngọ rue ubọchi nke Kraist; ebe unu gābu ndi juputaworo na nkpuru nke ezi omume, nke sitere n'aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto. Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n'iru; ya mere ab͕um putara ìhè nime Kraist na Pritoriọm dum, ya na n'ebe ndi nile fọduru nọ