FAILIMON 1:4-6
FAILIMON 1:4-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m ekele Chineke ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe. Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile. Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst.
Kesaa
Gụọ FAILIMON 1FAILIMON 1:4-6 Bible Nso (IGBOB)
Anamekele Chinekem mb͕e nile mb͕e m'necheta gi n'ekperem nile, ebe m'nānu okwu bayere ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi, bú okwukwe i kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya i huru ndi nsọ nile; ekpere m'nēkpe bu ka nnwekọ nke okwukwe-gi we ghọ ihe nālusi ọlu ike, nime nmazu nke ezi ihe nile ọ bula nke di nime ayi, rue na Kraist.
Kesaa
Gụọ FAILIMON 1