Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 9:1-14

ỌNU-ỌGUGU 9:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu ndị a nʼọzara Saịnaị nʼọnwa mbụ nʼafọ nke abụọ site nʼoge ha hapụrụ ala Ijipt. Ọ sịrị ya, “Gwa ụmụ Izrel ka ha mee Mmemme Ngabiga nʼoge a kara aka. Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.” Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga. Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu ONYENWE ANYị nyere Mosis si dị. Ma ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel esoghị mee Mmemme Ngabiga ahụ nʼihi na ha rụrụ arụ site nʼịnọ ozu nso. Nʼihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn nʼụbọchị ahụ, sị Mosis, “Anyị ghọrọ ndị rụrụ arụ nʼihi ịnọ ozu mmadụ nso. Gịnị ga-egbochi anyị iso ndị Izrel ndị ọzọ iwetara ONYENWE ANYị onyinye nʼoge a kara aka?” Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta ONYENWE ANYị ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na e nwee onye Izrel ọbụla nke merụrụ onwe ya nʼoge Mmemme Ngabiga site nʼịnọ ozu mmadụ nso, maọbụ site nʼịnọ nʼije, ha nwekwara ike iso mee Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYị. Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu. Ha agaghị erifọ ihe ọbụla nʼime ya ruo chi ọbụbọ ụbọchị so ya. Ha agaghị agbaji ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Mgbe ha mere Mmemme Ngabiga, ha ga-esorokwa ụzọ niile e si eme mmemme ahụ mee nke ha. Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge Mmemme Ngabiga ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ Izrel niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara ONYENWE ANYị onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya. “ ‘Onye ọbịa bi nʼetiti unu chọrọ iso na Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYị, ọ ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e nyere si dị. Unu ga-enwe otu iwu ahụ nye onye amụrụ nʼala na mbịarambịa.’ ”

ỌNU-ỌGUGU 9:1-14 Bible Nso (IGBOB)

Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'arọ nke-abua nke nputa ha si n'ala Ijipt puta, n'ọnwa mbu, si, Ka umu Israel me kwa ememe ngabiga na mb͕e-ya akara àkà. N'ubọchi nke-iri-na-anọ n'onwa nka, n'etiti ehihie na anyasi, ka unu gēme ya na mb͕e-ya akara àkà: dika ukpuru-ya nile si di, na dika ikpé-ya nile si di, ka unu gēme ya. Moses we gwa umu Israel okwu, si ha me ememe ngabiga ahu. Ha we me ememe ngabiga ahu n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, n'etiti ehihie na anyasi, n'ọzara Sainai: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka umu Israel mere. Ma ndikom ufọdu di, ndi bu ndi ruru árú site n'ozu madu, ha apughi kwa ime ememe ngabiga ahu n'ubọchi ahu: ha we biaru nso n'iru Moses na n'iru Eron n'ubọchi ahu: ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi bu ndi ruru árú site n'ozu madu: n'ihi gini ka anēb͕ochi ayi ka ayi we ghara iweta nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà n'etiti umu Israel? Moses we si ha, Guzonu; ka m'we nu ihe Jehova gēnye n'iwu bayere unu. Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ọ bula n'etiti unu ma-ọbu n'etiti ọb͕ọ-unu nile, mb͕e ọ gāru árú site na madu nwuru anwu, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ije di anya, ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga: n'ọnwa nke-abua n'ubọchi nke-iri-na-anọ n'etiti ehihie na anyasi ka ha gēme ya; tiyere achicha ekoghi-eko na ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya: ha agaghi-eme ka ihe fọdu site na ya rue ututu, ọ dighi kwa ọkpukpu ha gētiji nime ya: dika ukpuru nile nke ngabiga ahu si di ka ha gēme ya. Ma nwoke nke di ọcha, nke nānọghi kwa n'ije, ma ọ rapuwo ime ememe ngabiga, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya: n'ihi a o wetaghi nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà, nwoke ahu gēbu nmehie-ya. Ma mb͕e ọbìa gānọ n'etiti unu dika ọbìa, me-kwa-ra Jehova ememe ngabiga; dika ukpuru ngabiga ahu si di, na dika ikpé-ya si di, otú a ka ọ gēme: otù ukpuru ka unu gēnwe, ma ọbìa, ma onye amuru n'ala.