ỌNU-ỌGUGU 7:1-65
ỌNU-ỌGUGU 7:1-65 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Mosis guzobesiri ụlọ nzute ahụ ọtọ, o tere ya mmanụ. Doo ya na ihe niile e ji chọọ ya mma nsọ. O tekwara ebe ịchụ aja mmanụ, doo ya nsọ, ya na ngwongwo ya niile. Mgbe ahụ, ndị ndu Izrel, ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndị ndu ebo niile e tinyere ọrụ ịgụ ndị ahụ niile ọnụ wetara onyinye ha. Ha wetara dịka onyinye ha nye ONYENWE ANYị ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Nabata onyinye ndị a niile, ka e jiri ha rụọ ọrụ ụlọ nzute, were ha nyefee ndị Livayị nʼaka, onye ọbụla dịka mkpa ọrụ ya si dị.” Ya mere, Mosis nabatara ụgbọala ndị ahụ na ehi ndị ahụ, nyefee ha ndị Livayị nʼaka. O nyere ụmụ Geshọn ụgbọala abụọ na ehi anọ, dịka ọrụ ha si dị. Nye ụmụ Merari, ụgbọala anọ na ehi asatọ, dịka ọrụ ha si dị. Ha niile nọ nʼokpuru nlekọta Itama nwa Erọn, onye nchụaja. Mosis enyeghị ụmụ Kohat ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ nʼisi mbụ aka ha ka ha ji ebu ihe nsọ ndị ahụ ha ketara ibu. Ndị ndu ụmụ Izrel niile wetara onyinye ido nsọ nʼụbọchị e tere ebe ịchụ aja ahụ mmanụ ido ya nsọ. Ha wetara ha, debe ha nʼihu ebe ịchụ aja ahụ. Nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ka onyendu ọbụla weta onyinye nʼụbọchị dị iche iche, otu onye, otu ụbọchị, maka ido nsọ nke ebe ịchụ aja ahụ.” Ya mere, Nashọn nwa Aminadab onye si nʼebo Juda wetara onyinye nke ya nʼụbọchị nke mbụ. Onyinye o wetara bụ: efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule nke gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, na ebule ise, na mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Nashọn nwa Aminadab nyere. Nʼụbọchị nke abụọ, Netanel nwa Zua, onyendu ebo Isaka wetara onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Netanel nwa Zua. Nʼụbọchị nke atọ Eliab nwa Helọn onyendu ebo Zebụlọn wetakwara onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliab nwa Helọn wetara. Nʼụbọchị nke anọ, Elizọ nwa Shedeua onyendu ebo Ruben wetara onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Elizọ nwa Shedeua nyere. Nʼụbọchị nke ise Shelumiel nwa Zurishadai, onyendu ebo Simiọn butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Shelumiel nwa Zurishadai nyere. Nʼụbọchị nke isii, Eliasaf nwa Deuel onyendu ebo Gad butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliasaf nwa Deuel nyere. Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Elishama nwa Amihud nyere. Nʼụbọchị nke asatọ, Gamaliel nwa Pedazo onyendu ebo Manase nyere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Gamaliel nwa Pedazo nyere. Nʼụbọchị nke itoolu, Abidan nwa Gidiọn onyendu ebo Benjamin nyere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Abidan nwa Gidiọni nyere.
ỌNU-ỌGUGU 7:1-65 Bible Nso (IGBOB)
O rue, n'ubọchi Moses guzosiri ebe-obibi ahu, te ya manu, do ya nsọ, na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, mb͕e ọ tesiri ha manu, do ha nsọ; na ndi-isi Israel, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, wetara ihe nso; ndi ahu bu ndi-isi ebo nile, ndi ahu bu ndi nēguzo n'isi ndi agukọtara agukọta: ha we weta onyinye-ha iji biaru nso n'iru Jehova, ugbala isi nwere ihe-okpukpu, na ehi iri na abua; otù ugbala diri ndi-isi abua, otù ehi di-kwa-ra otù onye: ha we weta ha nso n'iru ebe-obibi ahu. Jehova we gwa Moses okwu, si, Nara ha n'aka-ha, ka ha we buru ihe iji fè òfùfè nke ulo-ikwū nzute; i gēwere kwa ha nye ndi Livai, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di. Moses we nara ugbala nile na ehi nile, nye ha ndi Livai. Ugbala abua na ehi anọ ka o nyere umu Giashon, dika òfùfè-ha si di: ugbala anọ na ehi asatọ ka o nye-kwa-ra umu Merari, dika òfùfè-ha si di, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà. Ma ọ nyeghi umu Kohat: n'ihi na òfùfè nke ebe nsọ dikwasi ha; n'ubu ka ha nēbu ya. Ndi-isi we weta nso onyinye irara ebe-ichu-àjà nye Chineke n'ubochi etere ya manu, ndi-isi ahu we weta nso onyinye-ha iji biaru nso n'iru ebe-ichu-àjà. Jehova we si Moses, Otù onye-isi otù ubọchi, otù onye-isi otù ubọchi, ka ha gēweta nso onyinye-ha iji biaru nso, bayere ira ebe-ichu-àjà nye Chineke. Onye nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso n'ubọchi mbu bu Nahshon nwa Aminadab, nke ebo Juda: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Nahshon nwa Aminadab. N'ubọchi nke-abua Netanel nwa Zua, onye-isi Isaka, wetara ihe-ya nso: o wetara nso onyinye-ya iji biaru nso: otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Netanel nwa Zua. N'ubọchi nke-atọ onye-isi umu Zebulun nwere, bú Eliab nwa Hilon, wetara ihe-ya nso; onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliab nwa Hilon. N'ubọchi nke-anọ onye-isi umu Reuben nwere, bú Elizua nwa Shedeua, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù, arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elizua nwa Shedeua. N'ubọchi nke-ise onye-isi umu Simeon nwere, bú Shelumiel nwa Zurishadai, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Shelumiel nwa Zurishadai. N'ubọchi nke-isi onye-isi umu Gad nwere, bú Eliasaf nwa Deuel, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure- ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliasaf nwa Deuel. N'ubọchi nke-asa onye-isi umu Efraim nwere, bú Elishama nwa Amihud, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elishama nwa Amihud. N'ubọchi nke-asatọ onye-isi umu Manase nwere, bú Gameliel nwa Pedahzua, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ iri na n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Gameliel nwa Pedahzua. N'ubọchi nke-iteghete onye-isi umu Benjamin nwere, bú Abidan nwa Gideoni, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Abidan nwa Gideoni.