ỌNU-ỌGUGU 5:11-31
ỌNU-ỌGUGU 5:11-31 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gwa Moses okwu, si Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nwunye nwoke ọ bula gējehie, we mekpue ihe-nmekpu megide ya, ya na nwoke ọzọ ewe dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ewe zopu ihe ahu n'anya di-ya kpuchi kwa ya, nwayi ahu ewe rua árú, ma ọ dighi onye-àmà megide ya, ejideghi kwa nwayi ahu; mọ ekworo ewe garue nwoke ahu aru, o we kwo nwunye-ya ekworo, nwayi ahu ewe rua áru: ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgarue ya arú, o we kwo nwunye-ya ekworo, ma nwayi ahu arughi árú: nwoke ahu gēme kwa ka nwunye-ya biakute onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa n'ihi nwunye-ya onyinye-ya iji biaru nso, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka barley; ọ gaghi-awukwasi ya manu, ọ gaghi-atukwasa ya frankincense; n'ihi na onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu, bú onyinye-inata-iruọma nke ihe-ncheta, nēme ka echeta ajọ omume. Onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ biarue nso, guzo ya n'iru Jehova: onye-nchu-àjà gēwere kwa miri nsọ n'iko ájá: ọ bu kwa ufọdu nime ájá nke di n'ala-ulo ebe-obibim ka onye-nchu-àjà gēwere, tiye ya nime miri ahu: onye-nchu-àjà gēguzo kwa nwayi ahu n'iru Jehova, tọpu agiri-isi nwayi ahu, tiye onyinye-inata-iru-ọma nke ihe-ncheta n'ọbu-aka-ya abua, onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu: ma n'aka onye-nchu-àjà ka miri ilu ahu gādi nke nēweta ọbubu-ọnu: onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ ṅua iyi, ọ gāsi nwayi ahu, Ọ buru na gi na nwoke edinaghi, ọ buru kwa na i jehieghi ime ihe ruru árú, mb͕e i nọ n'okpuru di-gi, gi pua na miri ilu a nke nēweta ọbubu-ọnu: ma asi na gi onwe-gi ejehiewo, mb͕e i nọ n'okpuru di-gi, asi kwa na i rua árú, nwoke nābughi di-gi ewe ra aru n'aru-gi: onye-nchu-àjà gēwere kwa iyi nke ọb͕ub͕a-iyi ahu me ka nwayi ahu ṅua iyi, onye-nchu-àjà gāsi nwayi ahu, Jehova gēme gi ka i buru ihe-ọb͕ub͕a-iyi ka i buru kwa ihe-oṅuṅu-iyi n'etiti ndi-gi, mb͕e Jehova nēme ka apata-ukwu-gi bua aru, me kwa ka afọ-gi za aza; miri a nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa na ngiri-afọ-gi, ime ka afọ-gi za aza, na ime ka apata-ukwu-gi bua aru: nwayi ahu gāsi kwa, Amen, Amen. Onye-nchu-àjà gēde kwa ọb͕ub͕a-iyi ndia n'akwukwọ, o gēhichapu kwa ha nime miri ilu ahu: ọ gēme kwa ka nwayi ahu ṅua miri ilu nke nēweta ọbubu-ọnu: miri ahu nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa nime ya ighọ ihe-ilu. Onye-nchu-àjà gānara kwa onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo n'aka nwayi ahu, fé onyinye-inata-iru-ọma ahu n'iru Jehova, weta ya nso ebe-ichu-àjà: onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu weju nweju-aka-ya, ka ọ buru ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, emesia ọ gēme ka nwayi ahu ṅua miri ahu. Ma mb͕e ọ meworo ka ọ ṅua miri ahu, ọ gēru kwa ọ buru na ọ rua árú, mekpu ihe-nmekpu megide di-ya, na miri ahu nke nēweta ọbubu-ọnu gābà nime ya ighọ ihe-ilu, afọ-ya gāza kwa, apata-ukwu-ya gābu kwa aru: nwayi ahu gābu kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi n'etiti ndi-ya. Ma ọ buru na nwayi ahu arughi árú, ma onye di ọcha ka ọ bu; ọ gāpu kwa ya, we turu ime. Nka bu iwu ekworo, mb͕e nwayi nējehie, mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya, ọ we rua árú; ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgaru nwoke n'aru, ọ we kwo nwunye-ya ekworo; o gēguzo kwa nwayi ahu n'iru Jehova, onye-nchu-àjà gēme kwa ya iwu a nile. Nwoke ahu gāpu kwa n'ajọ omume, ma nwayi gēbu ajọ omume-ya.
ỌNU-ỌGUGU 5:11-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ), ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya, nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma. “ ‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu ONYENWE ANYị. Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ. Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu ONYENWE ANYị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe ọ na-agwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, ọ bụrụ na ị kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe ị nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ. Ma ọ bụrụ na ị kpafuola mgbe ị ka nọ nʼụlọ di gị, ọ bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị,” (nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) “ka ONYENWE ANYị mee ka ndị ị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko. Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.” “ ‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.” “ ‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ. Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu. Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu ONYENWE ANYị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja. Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ. Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya. Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ. “ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya. Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu ONYENWE ANYị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a. A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’ ”