Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 33:40-56

ỌNU-ỌGUGU 33:40-56 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Onye Kenan bụ eze Arad, onye bi na Negev nʼime ala Kenan, nụrụ na ndị Izrel na-abịa. Ha hapụrụ ugwu Hor bịaruo Zalmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Zalmona bịaruo Punon ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Punon bịaruo Obot ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Obot bịaruo Iye Abarim, nʼoke ala ndị Moab. Ha hapụrụ Iye Abarim bịaruo Dibọn Gad ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Dibọn Gad bịaruo Almon Diblataim ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ ugwu Abarim bata nʼobosara ala Moab nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab. Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka ONYENWE ANYị nọ gwa Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan, unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe. Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya. Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị. “ ‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị niile bi nʼala ahụ, ndị unu hapụrụ ga-abụrụ unu iberibe unyi nʼanya unu. Ha ga-adịkwara unu ka ogwu nke ga-adụkasị unu ahụ. Ha ga-enye unu nsogbu nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. Mgbe ahụ kwa, aga m emeso unu ụdị mmeso ahụ m na-akwado imeso ha ugbu a.’ ”

ỌNU-ỌGUGU 33:40-56 Bible Nso (IGBOB)

Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo. Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona. Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon. Ha si na Punon bulie, ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot. Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ókè-ala Moab. Ha si n'Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad. Ha si na Dibon-gad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Almon-diblataim. Ha si n'Almon-diblataim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Abarim, n'iru Nebo. Ha si n'ugwu Abarim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab, n'akuku Jọdan na nso Jeriko. Ha ma ulo-ikwū-ha n'akuku Jọdan, site na Bet-jeshimot rue Ebel-shitim n'ala ihe nādighi nke Moab. Jehova we gwa Moses okwu n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si, Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ba n'ala Kenean, unu gānapu kwa n'aka ndi nile bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu, unu gāla kwa nkume-ha nile nke emere ka ha yie ihe n'iyi, onyinyo-ha nile awuru awu ka unu gāla kwa n'iyì, me kwa ka ebe di elu nile tọb͕ọrọ n'efu. Unu gēnweta kwa ala ahu, biri nime ya: n'ihi na ọ bu unu ka M'nyeworo ala ahu inweta ya. Unu gēketa kwa ala ahu n'ife-nzà dika ab͕uru nile unu si di; ndi bara uba ka unu gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà: ebe ọ bula nzà ahu gāmara onye ọ bula, ọ gēnwe ya; dika ebo nile nke nna-unu-hà si di ka unu gēketa. Ma ọ buru na unu anapughi n'aka ndi bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu; ọ gēru kwa na ndi unu kwere ka ha fọdu site na ndi ahu gāghọ kwa obi-ogwu n'anya-unu, ghọ kwa ogwu n'akuku-unu, ha gākpab͕u kwa unu n'ala ahu nke unu onwe-unu nēbi nime ya. O gēru kwa, na dika M'chère ime ha, otú a ka M'gēme unu.