ỌNU-ỌGUGU 27:1-11
ỌNU-ỌGUGU 27:1-11 Bible Nso (IGBOB)
Ha we biarue nso, bú umu-ndinyom Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, nke ab͕uru Manase nwa Josef: ndia bu aha umu-ya ndinyom; Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza. Ha we guzo n'iru Moses, na n'iru Eleeza, bú onye-nchu-aja, na n'iru ndi-isi na nzukọ Israel nile, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, si, Nna-ayi nwuru n'ọzara, ma ya onwe-ya adighi n'etiti nzukọ ahu ndi nēzukọ imegide Jehova nime nzukọ Kora: ma nime nmehie nke aka ya ka ọ nwuru: ma ọ dighi umu-ndikom o nwere. N'ìhi gini ka agāgupu aha nna-ayi n'etiti ab͕uru-ya, n'ihi na o nweghi nwa-nwoke? Nye ayi ihe-onwunwe n'etiti umu-nne-nna-ayi ndikom. Moses we weta ikpé-ha nso n'iru Jehova. Jehova we gwa Moses okwu, si, Ọ bu ihe ziri ezi ka umu-ndinyom Zelọfehad nēkwu: i ghaghi inye ha ihe-onwunwe nke ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha ndikom; i gēme kwa ka ihe-nketa nna-ha gabiga rue ha aka. Ọ bu kwa umu Israel ka i gāgwa okwu, si, Mb͕e nwoke gānwu, ma o nweghi nwa-nwoke, unu gēme kwa ka ihe-nketa-ya gabiga rue nwa-ya nwayi aka. Ma ọ buru na o nweghi nwa-nwayi, unu gēnye kwa umunne-ya ndikom ihe-nketa-ya. Ma ọ buru na ọ nweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa umu-nne nna-ya ndikom ihe-nketa-ya. Ma ọ buru na nna-ya enweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa onye-aru-ya nke di ya nso site n'ab͕uru-ya ihe-nketa-ya, ọ gēnweta kwa ya: ọ gābu-kwa-ra umu Israel ukpuru ikpé, dika Jehova nyere Moses iwu.
ỌNU-ỌGUGU 27:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị, “Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide ONYENWE ANYị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke. Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.” Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu ONYENWE ANYị. Ma ONYENWE ANYị zaghachiri Mosis sị ya, “Ihe ụmụ Zelofehad na-ekwu ziri ezi. Ị ghaghị ikenye ha oke nʼetiti ụmụnne nna ha, ma nyefeekwa ha oke ruru nna ha. “Gwa ndị Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị. Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke. A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke. Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka ONYENWE ANYị si nye ya Mosis nʼiwu.’ ”