ỌNU-ỌGUGU 25:6-8
ỌNU-ỌGUGU 25:6-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, otu nwoke onye Izrel kpọbatara nʼime ụlọ ikwu otu nwanyị onye Midia, nʼihu Mosis na nzukọ Izrel niile, mgbe ha niile nọ na-akwa akwa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Mgbe Finehaz na Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja hụrụ ihe a, ọ hapụrụ ọgbakọ Izrel. O were ùbe nʼaka ya, soro nwoke ahụ baa nʼime ụlọ, ebe ya na nwaagbọghọ ahụ dina. Ọ mara ha ùbe ahụ, nke si nʼahụ nwoke ahụ gafee mikpuo nʼafọ nwaagbọghọ ahụ. Nke a mere ka ihe otiti ahụ na-emegide ndị Izrel kwụsị.
ỌNU-ỌGUGU 25:6-8 Bible Nso (IGBOB)
Ma, le, otù nwoke nime umu Israel biara, weta nso umu-nne-ya otù nwayi Midian n'anya Moses, na n'anya nzukọ nile nke umu Israel, mb͕e ha onwe ha nākwa ákwá n'ọnu-uzọ ulo-kwū nzute. Finehas, nwa-nwoke Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, we hu ya, o we si n'etiti nzukọ Israel bilie, were ube n'aka-ya, soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n'aru umu Israel.