ỌNU-ỌGUGU 22:1-20
ỌNU-ỌGUGU 22:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị Izrel biliri njem bịarute nʼobosara ala Moab. Manye ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Jọdan ebe chere ihu nʼobodo Jeriko. Ma Balak nwa Zipoa ahụlarị ihe niile Izrel mere ndị Amọrait. Oke ụjọ jidere ndị Moab nʼihi na ndị Izrel dị ọtụtụ. Nʼezie, oke ụjọ dị ukwuu jidere ndị Moab nʼihi ụmụ Izrel. Ndị Moab jekwuru ndị okenye Midia sị ha, “Igwe mmadụ ndị a ga-erichapụ ihe niile gbara anyị gburugburu. Ha ga-eripịa ha dịka ehi si erichapụ ahịhịa ndụ dị nʼala.” Ya mere, Balak nwa Zipoa, onye bụ eze ndị Moab nʼoge ahụ, zigara ndị ozi ya ka ha jekwuru Belam, nwa Beoa onye bi nʼobodo ya bụ Petoa, nke dị nso nʼiyi ukwu Yufretis. O ziri ya sị, “Lee otu ndị sitere nʼIjipt pụta. Lee ka ha si kpuchie elu ala a; ugbu a, ha bi nʼakụkụ m. Ugbu a, bịa ka ị bụọrọ m ha ọnụ, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ma eleghị anya aga m enwe ike merie ha, ma chụpụkwa ha site nʼala m. Nʼihi na amaara m na ndị ọbụla ị gọziri bụ ndị a gọziri agọzi, ndị ọbụla ị bụrụ ọnụ ga-anọgide bụrụ ndị a bụrụ ọnụ.” Ndị ozi o zigara bụ ndị okenye obodo Moab na Midia. Ha ji ego ịjụta ase nʼaka ha. Mgbe ha ruru, ha ziri Belam ozi Balak ziri. Belam gwara ha okwu sị, “Nọdụnụ nʼebe a nʼabalị a. Aga m ewetara unu ọsịsa ọbụla ONYENWE ANYị nyere m.” Ya mere, ndị ozi ahụ si Moab nọnyeere ya. Nʼabalị ahụ, Chineke bịakwutere Belam jụọ ya sị, “Ndị ikom ndị a bịara ileta gị, ha bụ ndị ole?” Belam sịrị Chineke, “Balak nwa Zipoa eze Moab zitere m ozi sị m, ‘Otu ndị esitela nʼala Ijipt pụta, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Achọrọ m ka ị bịa bụọrọ m ha ọnụ. Ma eleghị anya aga m enwe ike lụso ha agha, ma chụpụkwa ha.’ ” Ma Chineke sịrị Belam, “Esola ha aga! Ị gaghị abụ ndị a ọnụ, nʼihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.” Mgbe chi bọrọ, Belam biliri gwa ndị ozi Balak sị ha, “Laghachinụ nʼobodo unu nʼihi na ONYENWE ANYị ekweghị ka m soro unu.” Ya mere, ndị ozi Moab laghachikwuru Balak gwa ya sị, “Belam jụrụ iso anyị lọghachi.” Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ. Ha jiri ozi a bịakwute Belam sị ya, “Ihe a ka Balak nwa Zipoa sị anyị zie gị, Ọ sị gị ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịbịakwute m. Nʼihi na aghaghị ịsọpụrụ gị nʼebe ọ dị ukwuu m, mekwaa ihe ọbụla ị sị m mee. Naanị bịa ka ị bụọrọ m ndị a ọnụ.” Ma Belam zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na Balak enye m ụlọeze ya nke juputara nʼọlaọcha na ọlaedo, apụghị m ime ihe ọbụla dị ukwuu maọbụ nke nta ịgabiga iwu ONYENWE ANYị bụ Chineke m. Ma otu ọ dị, nọọnụ ka chị bọọ dịka ndị ọzọ ahụ mere ka m nwee ike chọpụta ma ọ dị ihe ONYENWE ANYị ga-atụkwasị nʼihe o kwuru na mbụ.” Nʼabalị ahụ, Chineke gwara Belam okwu sị ya, “Ebe ọ bụ na ndị a bịara ịkpọ gị oku, bilie soro ha gaa, kama jikere ikwu naanị okwu m ga-etinye gị nʼọnụ.”
ỌNU-ỌGUGU 22:1-20 Bible Nso (IGBOB)
Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab n'ofè Jọdan na nso Jeriko. Belak nwa Zipoa we hu ihe nile Israel mereri ndi-Amorait. Moab we tua ujọ ndi Israel nke-uku, n'ihi na ọtutu ka ha di; ike gwusia Moab n'iru umu Israel. Moab we si ndi-okenye Midian, Ub͕u a nkpọkọta nka gārachapu ihe nile nke di ayi buruburu, dika ehi nārachapu akwukwọ ndu nke ọhia. Belak nwa Zipoa bu kwa eze Moab na mb͕e ahu. Ọ we zigara Belam nwa Beoa ndi-ozi, rue Petoa, nke di n'akuku Osimiri, bú ala nke umu ndi-ya, ikpọ ya, si, Le, otù ndi esiwo n'Ijipt puta: le, ha ekpuchiwo iru ala, ndi ahu nānọ kwa na ncherita-irum: ma ub͕u a, biko, bia, buaram ndi nka ọnu; n'ihi na ndi di ike ka ọ bu karim: eleghi anya m'gēnwe ike, ka ayi we tib͕ue ha, m'we chupu ha n'ala: n'ihi na amawom na onye i nāgọzi bu onye agọziri agọzi, ma onye i nābu ọnu bu onye anābu ọnu. Ndi-okenye Moab na ndi-okenye Midian we je, ihe nile iji ju ase di kwa n'aka-ha; ha we biakute Belam, gwa ya okwu nile nke Belak. o we si ha, Nọnu ọnọdu-abali n'ebe a n'abali a, m'gēweghachi-kwa-ra unu okwu, dika Jehova si agwam okwu: ndi-isi Moab we nọyere Belam. Chineke we biakute Belam, si, Òle ndi bu ndikom ndia nọyere gi? Belam we si Chineke, Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, eziteworom ozi, si, Le, ndi ahu nke si n'Ijipt puta, ọ nēkpuchi kwa iru ala: ub͕u a, bia kọcharam ha; eleghi anya m'gēnwe ike ibuso ha agha, m'gāchupu kwa ha. Chineke we si Belam, Esola ha je; abula ndi Israel ọnu; n'ihi na ndi agọziri agọzi ka ha bu. Belam we bilie n'ututu, si ndi-isi Belak, Lanu n'ala-unu: n'ihi na Jehova n'aju ikwe ka m'soro unu je. Ndi-isi Moab we bilie, biakute Belak, si, Belam nāju isoro ayi bia. Belak we ziga kwa ndi-isi ọzọ, di ọtutu, di kwa nsọpuru, kari ndi ahu. Ha we biakute Belam, si ya, Otú a ka Belak nwa Zipoa siri, Biko, ekwela ka ihe b͕ochie gi ibiakutem: n'ihi na m'ghaghi isọpuru gi nke-uku, ọ bu kwa ihe ọ bula i gāsim ka m'gēme: ma, biko, bia, kọcharam ndi nka. Belam we za, si ndi-orù Belak, Ọ buru na Belak enyewo m ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu nke Jehova, bú Chinekem, ime ihe ntà ma-ọbu ihe uku. Ma ub͕u a, biko, nọdunu n'ebe a, ọbuná unu onwe-unu, abali a, ka m'we mara uka Jehova gākpayere m ọzọ. Chineke we biakute Belam n'abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M'nāgwa gi, nke ahu ka i gēme.