Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 21:4-35

ỌNU-ỌGUGU 21:4-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a. Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.” Ya mere, ONYENWE ANYị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel. Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola ONYENWE ANYị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị ONYENWE ANYị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.” Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ. Ụmụ Izrel biliri njem, manye ụlọ ikwu ha na Obot. Ha sikwa nʼObot bilie njem, maa ụlọ ikwu ha na Iye Abarim, nʼọzara ahụ nke chere ihu nʼobodo Moab, nʼụzọ ọwụwa anyanwụ. Ha si nʼebe ahụ bilie njem, manye ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Zered. Ha sitekwara nʼebe ahụ bilie njem, maa ụlọ ikwu ha nʼofe iyi Anọn nke dị nʼọzara ruru nʼoke ala ndị Amọrait. Iyi Anọn bụ oke ala Moab, nʼetiti ndị Moab na ndị Amọrait. Nʼihi nke a, nʼAkwụkwọ Agha dị iche iche nke ONYENWE ANYị na-asị, “Waheb nʼime Sufa ya na ndagwurugwu niile Anọn na mgbadata ndagwurugwu ndị ahụ nke gbasapụrụ ruo nʼebe Ar dị, nke tọgbọrọ nʼoke ala Moab.” Mgbe ahụ, ụmụ Izrel niile biliri njem bịarute Bịa bụ nʼolulu mmiri ahụ ONYENWE ANYị nyere Mosis iwu sị, “Kpọkọtaa ndị Izrel niile, nʼihi na m na-aga inye ha mmiri.” Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bụrụ abụ a. “Sọpụta gị olulu mmiri! Bụọnụ abụ banyere mmiri a! Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwuru nke ndị ndu anyị doziri. Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.” Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana. Ha si Matana jeruo Nahaliel, si Nahaliel jeruo Bamot. Sitekwa Bamot rute na ndagwurugwu ahụ dị nʼọhịa Moab, ruo nʼugwu Pisga, nke chere ihu nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu. Ndị Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn, eze ndị Amọrait, sị ya, “Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.” Ma Saịhọn ekweghị na ụmụ Izrel ga-esi nʼoke ala ya gafee. Ọ chịkọtara ndị agha ya niile, zọpụ ije ibu agha megide ndị Izrel nʼime ọzara ahụ. Mgbe o rutere Jehaz, ọ lụsoro Izrel agha. Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa. Ndị Izrel lụgburu obodo niile nke ndị Amọrait bichie nʼime ha, tinyere Heshbọn na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn. Ọ bụ nke a mere ndị na-arọ abụ ji kwuo sị, “Bịa na Heshbọn ka e wukwaa ya, ka e mee ka isi obodo eze Saịhọn guzosie ike. “Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ. Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn, rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab, ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn. Ahụhụ dịrị gị Moab! Ndị a lara nʼiyi ka unu bụ, unu ndị Kemosh. Ụmụ ya ndị ikom aghọọla ndị na-enweghị ebe obibi. A dọtala ụmụ ndị inyom nʼagha, nye Saịhọn eze ndị Amọrait. “Ma anyị ebibiela ha, bibie Heshbọn ruo rịị na Dibọn, bibie ha ruo Nofa, ruokwa rịị Medeba.” Ya mere, ụmụ Izrel bichiri nʼala ndị Amọrait. Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ. Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei. Ma ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu, sị, “Atụla ya egwu nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait onyeisi obodo ya bụ Heshbọn.” Ya mere, ha gburu ya, tinyere ụmụ ya na ndị agha ya niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ nye ha. Ha nwetakwara ala ha, biri nʼime ya.

ỌNU-ỌGUGU 21:4-35 Bible Nso (IGBOB)

Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije ga n'uzọ Oké Osimiri Uhie, iga ala Edom buruburu: ma nkpuru-obi ndi Israel enweghi ntachi-obi n'uzọ ahu. Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé. Jehova we zite agwọ ahu nke yiri ọku n'etiti ndi Israel, ha we ta ndi Israel aru; ndi riri nne nwupuru n'Israel. Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n'aru ayi. Moses we kpe ekpere n'ihi ndi Israel. Jehova we si Moses, Mere onwe-gi agwọ yiri ọku, tukwasi ya n'ọkọlọtọ: o gēru kwa, na onye ọ bula ataworo gādi ndu, mb͕e ọ huworo ya anya. Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n'ọkọlọtọ ahu: o rue, ma ọ buru na agwọ atawo madu, na ọ di ndu, mb͕e ọ legidere agwọ ọla ahu anya. Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot. Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ọzara ahu nke di n'iru Moab, n'uzọ ọwuwa-anyanwu. Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Zered. Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon, nke di n'ọzara, nke si n'ókè-ala ndi-Amorait aputa: n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab, n'etiti Moab na ndi-Amorait. N'ihi ya ka anāsi n'akwukwọ agha di iche iche nke Jehova, Vaheb nime Sufa, Na ndagwurugwu nile nke Anon, Na nkpọrube nke ndagwurugwu ahu, Bú nke nēwezuga onwe-ya n'uzọ ebe-obibi A, Nke nādabere kwa n'ókè-ala Moab. Ha si n'ebe ahu jerue Bia: nke ahu bu olùlù-miri ahu nke Jehova gwara Moses okwu bayere ya, si, Chikọta ndim, M'gēnye kwa ha miri. Mb͕e ahu Israel nābù abù a, si: Rigo, gi olùlù-miri; zanu ya: Olùlù-miri, ndi-isi gwuru ya, Ndi amara aha-ha nke ndi Israel doziri ya, Ha ji nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru, ji kwa nkpa-n'aka nile ha, me ya. Ha si n'ọzara ahu jerue Matana: si na Matana jerue Nahaliel: si na Nahaliel jerue Bamot: si na Bamot jerue ndagwurugwu ahu nke di n'ọhia Moab, rue elu Pisga, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di. Israel we ziga ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, si, Ka m'gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi ba n'ọhia, ma-ọbu n'ubi-vine, ayi agaghi-aṅu miri olùlù-miri: n'uzọ eze ka ayi ganēje, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè- ala-gi. Ma Saihon ekweghi ka Israel gabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, pua izute Israel rue ọzara, biarue Jehaz: ọ we buso Israel agha. Israel we were ọnu mma-agha tib͕ue ya, we nweta ala-ya site n'Anon rue Jekob, rue umu Amon: n'ihi na ókè-ala umu Amon siri ike. Israel we were obodo ndia nile: Israel we biri n'obodo nile nke ndi-Amorait, nime Heshbon, na nime umu-obodo-ya nile. N'ihi na Heshbon ahu, obodo Saihon, bú eze ndi-Amorait, ka ọ bu, eze ahu buso-kwa-rari eze gara aga Nke Moab agha, we nara ala-ya nile n'aka-ya, rue Anon. N'ihi ya ndi nātu ilu nāsi, Banu nime Heshbon, Ka ewue obodo Saihon, ka eguzosi kwa ya ike: N'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, Ire-ọku n'obodo Saihon: O ripiawo A nke Moab, Ndi-nwe ebe nile di elu nke Anon. Ahuhu gādiri gi, Moab! I lawo n'iyì, gi ndi Kemosh: Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu, Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n'agha, N'aka Saihon, bú eze ndi-Amorait. Ayi ab͕awo ha àkú; Heshbon alawo n'iyì rue Dibon, Ayi emewo ka ọ tọb͕ọrọ n'efu rue Nofa, Nke diruru Medeba. Israel we biri n'ala ndi-Amorait. Moses we ziga iledo Jeza, ha we were umu-obodo-ya nile, napu ndi-Amorait ndi biri n'ebe ahu ala-ha. Ha we chigharia, rigo n'uzọ Bechan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha n'Edrei. Jehova we si Moses, Atula egwu ya; n'ihi na ọ bu n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke biri nime Heshbon. Ha we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru arapuru ya: ha we nweta ala-ya.