Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 7:1-73

NEHEMAIA 7:1-73 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị. Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ. Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.” Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị. Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya: Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya. Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a: Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172), nke Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372), nke Ara, narị isii na iri ise na abụọ (652), nke Pahat-Moab site nʼụmụ Jeshua na Joab, puku abụọ, na narị asatọ na iri na asatọ (2,818), nke Elam, otu puku, na narị abụọ na iri ise na anọ (1,254), nke Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise (845), nke Zakai, narị asaa na iri isii (760), nke Binui, narị isii na iri anọ na asatọ (648), nke Bebai, narị isii na iri abụọ na asatọ (628), nke Azgad, puku abụọ, na narị atọ na iri abụọ na abụọ (2,322), nke Adonikam, narị isii na iri isii na asaa (667), nke Bigvai, puku abụọ, na iri isii na asaa (2,067), nke Adin, narị isii na iri ise na ise (655), nke Atea (site na Hezekaya), iri itoolu na asatọ (98), nke Hashum, narị atọ na iri atọ na asatọ (328), nke Bezai, narị atọ na iri abụọ na anọ (324), nke Harif, otu narị na iri na abụọ (112), nke Gibiọn, iri itoolu na ise (95). Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ (188), ndị Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ (128), ndị Bet-Azmavet, iri anọ na abụọ (42), ndị Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743), ndị Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu (621), ndị Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ (122), ndị Betel na Ai, otu narị na iri abụọ na atọ (123), ndị Nebo nke ọzọ, iri ise na abụọ (52), ndị agbụrụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254), ndị Harim, narị atọ na iri abụọ (320), ndị Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345), ndị Lod, Hadid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na otu (721), ndị Senaa, puku atọ, na narị itoolu na iri atọ (3,930). Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya site nʼezinaụlọ Jeshua, narị itoolu na iri asaa na atọ (973), ndị Imea, otu puku, na iri ise na abụọ (1,052), ndị Pashua, otu puku, na narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247), ndị Harim, otu puku, na iri na asaa (1,017). Ndị Livayị: ndị agbụrụ Jeshua site na Kadmiel nke ụmụ Hodavaya, iri asaa na anọ (74). Ndị ọbụ abụ: ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri anọ na asatọ (148). Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai otu narị, na iri atọ na asatọ (138). Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot, Keros, Sia, Padon, Lebana, Hagaba, Shalmai, Hanan, Gidel, Gaha, Reaya, Rezin, Nekoda, Gazam, Ụza, Pasea, Besai, Meunim, Nefusim, Bakbuk, Hakufa, Hahua, Bazlut, Mehida, Hasha, Bakos, Sisera, Tema, Nezaya na Hatifa. Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Soferat, Perida, Jaala, Dakon, Gidel, Shefataya, Hatil, Pokeret-Hazebaim na Amọn. Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392). Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel. Ndị agbụrụ: Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ (642). Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ: Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha). Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha. Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase. Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360), nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ, na iri anọ na ise (245). Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise (245), ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ (6,720). Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo (1,000), iri efere ọlaedo ise (50) na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ (530). Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ (2,200). Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na minas ọlaọcha puku abụọ (2,000), na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa (67). Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha.

NEHEMAIA 7:1-73 Bible Nso (IGBOB)

O rue, mb͕e alusiri mb͕idi ahu, mb͕e m'guzosi-kwa-ra ibo-ọnu-uzọ-ya nile, mb͕e emesi-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama na ndi-ọbù-abù na ndi-Livai ka ha lekọta ozi-ha, na m'nyere Hanani, bú nwa-nnem, na Hananaia, bú onye-isi ulo uku eze, iwu bayere Jerusalem: n'ihi na onye ahu bu onye ezi-okwu, ọ nātu kwa egwu Chineke kari ọtutu madu. M'we si ha, Ka aghara imeghepu ọnu-uzọ-ama Jerusalem rue mb͕e anyanwu di ọku; na mb͕e ndi-nche nēguzo kwa na nche-ha, ka ha mechie uzọ, kpọchi-kwa-nu ha: guzo kwa ndi bi na Jerusalem na nche, nwoke ọ bula nime nche-ya, nwoke ọ bula kwa na ncherita-iru ulo-ya. Ma obodo ahu sara mbara n'aka abua, di kwa uku: ma ndi-ayi di ole-na-ole n'etiti ya, ulo adighi kwa nke ewuru ewu. Chinekem we tiye ya n'obim, m'we chikọta ndi amara aha-ha, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ayi nile, ka ewe de ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu. M'we chọta akwukwọ osuso-ọmumu nke ndi rigotaworo na mbu, m'we hu ihe a edeworo nime ya: Ndia bu umu ala ahu anāchi achi, ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha we lata na Jerusalem, lata kwa na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya; ndi nābia, ha na Zerubabel, na Jeshua, na Nehemaia, na Azaraia, na Raamia, na Nahamani, na Mọdekai, na Bilshan, na Misperet, na Bigvai, na Nehum, na Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel: Umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua. Umu Shefataia ọgu iri-na-asatọ na iri na abua. Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua. Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na asatọ. Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. Umu Zatu, nnù abua na ọgu abua na ise. Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ. Umu Binui, nnù na ọgu iri-na-abua na asatọ. Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na asatọ. Umu Azgad, nnù ise na ọgu iri-na-isi na abua. Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na asa. Umu Bigvai, nnù ise na ọgu atọ na asa. Umu Adin, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na ise. Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ. Umu Hashum, ọgu iri-na-isi na asatọ. Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na anọ. Umu Harif, ọgu ise na iri na abua. Umu Gibeon, ọgu anọ na iri na ise. Ndikom Bet-lehem na Netofa, ọgu iteghete na asatọ. Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ. Ndikom Bet-azmavet, ọgu abua na abua. Ndikom Kiriat-jearim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ. Ndikom Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù. Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua. Ndikom Bet-el na Ai, ọgu isi na atọ. Ndikom Nebo nke-ọzọ, ọgu abua na iri na abua. Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. Umu Harim, ọgu iri-na-isi. Umu jeriko, ọgu iri-na-asa na ise. Umu Lod na Hadid na Ono, nnù n' ọgu na iri-na-isi na otù. Umu Senaa, nnù iteghete na ọgu iri-na-isi na iri. Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ. Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua. Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa. Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa. Ndi Livai: umu Jeshua, nke Kadmiel, nke umu Hodeva, ọgu atọ na iri na anọ. Ndi ọbù-abù: umu Esaf, ọgu asa na asatọ. Ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ọgu isi na iri na asatọ. Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot; na umu Keros, na umu Sia, na umu Padon; na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Salmai; na umu Hanan, na umu Gidel, na umu Gaha; na umu Reaia, na umu Rezin, na umu Nekoda; na umu Gazam, na umu Uza, na umu Pasea; na umu Besai, na umu Meunim, na umu Nefushesim; na umu Bakbuk, na umu Hakufa, na umu Hahua; na umu Bazlit, na umu Mehida, na umu Hasha; na umu Bakos, na umu Sisera, na umu Tema; na umu Nezia, na umu Hatifa. Umu ndi-orù Solomon: umu Sotai, na umu Soferet, na umu Perida; na umu Jaala, na umu Dakon, na umu Gidel; na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazebaim, na umu Emon. Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua. Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adon na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, ma-ọbu nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta: umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na abua. Site kwa na ndi-nchu-àjà: umu Họbaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n'aha-ha. Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n'etiti ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ya: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n'ọlu-nchu-àjà. Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo. Nkpọkọta ahu nile n'otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ, nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri-na-abua na ise bu ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù. Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise; camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi. Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna nyere onyinye nke diri ije-ozi ahu. Tiashata tiyere n'ulo-àkù nnù daric ọla-edo abua na ọgu iri, na ọgu ọkwa-nwusa abua na iri, na nnù uwe ndi-nchu-àjà na ọgu isi na iri. Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna tiyere n'ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla-ọcha ise na ọgu iri. Ma nke ndi-ayi fọduru nyere di orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla ọcha ise, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà atọ na asa. Ndi-nchu-aja, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na ufọdu nime ndi Juda, na Netinim, na Israel nile, we biri n'obodo nile ha. Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha.