NEHEMAIA 6:1-9
NEHEMAIA 6:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe a gwara Sanbalat, na Tobaya, na Geshem onye Arab, na ndị iro anyị ndị ọzọ na m ewuzichaala mgbidi ahụ, na ọ dịkwaghị ntipu fọdụrụ na ya, ọ bụ ezie na nʼoge ahụ, etinyebeghị m ibo nʼọnụ ụzọ ama ya niile, Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.” Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ. Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?” Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ. Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa. Nke a bụ ihe e dere nʼime ya; “Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha, na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.” Ma eziri m ya ozi sị, “O nweghị eziokwu ọbụla dị nʼihe ị na-ekwu, nʼihi na ha bụ ihe i chepụtara nʼobi gị.” Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.” Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.”
NEHEMAIA 6:1-9 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e Sanbalat, na Tobaia, na Geshem, bú onye Arebia, na ndi-iro-ayi fọduru, nuru na m'lusiri mb͕idi ahu, na ọ dighi kwa ntipú fọduru nime ya; (ọ bu ezie na akaghm-eguzo ibo-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile rue mb͕e ahu;) o rue, na Sanbalat na Geshem ziterem ozi, si, Bia, ka ayi zukọta n'otù n'obodo ntà nime ndagwurugwu nke Ono. Ma ndi ahu nēchè èchìchè imejọm emejọ. M'we zigara ha ndi-ozi, si, Ozi uku ka m'nēje, apughkwam irida: n'ìhi gini ka ozi a gākwusi, mb͕e m'nārapu ya, we ridakuru unu? Ha we ziterem ozi ub͕ò anọ dika okwu a si di; m'we zaghachi ha okwu dika okwu a si di. Sanbalat we ziterem onye nējere ya ozi nke ub͕ò ise dika okwu a si di, ya na akwukwọ-ozi nke emegheworo n'aka-ya; edewo nime ya, si, Anuwo ya n'etiti mba nile ọzọ, Gashmu nāsi kwa, na gi onwe-gi na ndi-Ju nēchè èchìchè inupu isi; n'ihi nka ka gi onwe-gi nālu mb͕idi ahu: gi onwe-gi aghọwo-kwa-ra ha eze, dika okwu ndia si di. Ọzọ kwa, i guzowo ndi-amuma ikpọsa òkù bayere gi nime Jerusalem, si, Eze di nime Juda: ma ub͕u a eze gānu ya dika okwu ndia si di. Ma ub͕u a bia, ka ayi durita onwe-ayi ọdu. M'we zigara ya ozi, si, Ọ dighi ka okwu ndia si di nke gi onwe-gi nēkwu, kama gi onwe-gi nēchèputa ha n'obi-gi. N'ihi na ha nile nēme ka ayi tua egwu, si, Aka-ha gākudapu n'ije-ozi a, agaghi-eje kwa ya. Ma ub͕u a Gi me ka akam abua di ike.