Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 5:1-19

NEHEMAIA 5:1-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge ahụ, ụfọdụ ezinaụlọ bidoro itamu ntamu megide ndị Juu ibe ha. Ụfọdụ na-atamu na-asị, “Anyị na ụmụ anyị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị ga-eri nri dị ndụ, o kwesikwara ka anyị nwee ike ịzụrụ ọka.” Ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị agbaala ubi anyị, ubi vaịnị anyị na ụlọ anyị nʼibe ka anyị nweta mkpụrụ ubi nʼoge ụnwụ.” Ma ndị ọzọkwa na-asị, “Lee na anyị gbazitere ego anyị ji tụọ ụtụ isi eze maka ubi anyị na ubi vaịnị anyị. Nʼagbanyeghị na ọ bụ otu anụ ahụ na ọbara ka anyị na ndị Juu ọzọ nwere, dịka ụmụ ha dị ka ụmụ anyị dịkwa, ma anyị emeela ka ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom bụrụ ndị ohu. Ụfọdụ nʼime ụmụ anyị ndị inyom abụrụlarị ndị ohu, ma anyị enweghị ike nke aka anyị, nʼihi na ndị ọzọ bụ ndị nwezi ala ubi anyị na ubi vaịnị anyị niile.” Iwe were m nke ukwuu mgbe m nụrụ mkpu akwa ha na mkpesa ndị a. Ya mere, mgbe m chesiri echiche banyere ya, e boro m ndị a na-asọpụrụ na ndị ọchịchị ebubo. A gwara m ha, “Unu na-anara ụmụnna unu ọmụrụnwa ego unu enyere ha.” Ya mere, a kpọrọ m nzukọ ọha mmadụ maka imegide ha. Nʼụbọchị nzukọ ahụ, agwara m ha okwu sị, “Ọtụtụ nʼime anyị na-agbalị nʼụzọ niile ịhụ na anyị zụtaghachiri ụmụnna anyị ndị Juu bu ndị e resiri ndị mba ọzọ. Ma unu nọ nʼebe a na-agbalị ime ha ka ha ghọọ ndị ohu unu. Ruo ole mgbe ka anyị ga-anọgide na-agbapụta ha site nʼọnọdụ ibu ohu?” Ma ha niile ekwughị okwu ọbụla, nʼihi na ha enweghị ihe ha ga-ekwu. Agwakwara m ha okwu ọzọ sị, “Ihe unu na-eme jọrọ njọ. O kwesighị ka unu tụọ egwu Chineke si otu a gbanarị nkọcha nke ndị iro anyị, bụ ndị mba ọzọ?” Mụ onwe m na ụmụnna m na ndị na-ejere m ozi na-agbazinye ụmụnne anyị ego na ọka. Ma ka anyị kwụsị ịnara ọmụrụnwa. Nyeghachinụ ha ala ubi ha niile ngwangwa, ma ubi vaịnị ha niile, ubi oliv ha niile, ụlọ ha niile na ọmụrụnwa nke unu na-anara ha nke bụ otu ụzọ nʼime narị nke ego, ọka, mmanya ọhụrụ na mmanụ. Ha sịrị, “Anyị ga-enyeghachi ha. Anyị agakwaghị anara ha ihe ọzọ. Anyị ga-emezu ihe i kwuru.” Mgbe ahụ, akpọkọtara m ndị nchụaja, mee ka ndị ndu na ndịisi ozi ṅụọ iyi imezu nkwa ha. Ayọgharịrị m ọnụ ọnụ uwe mwụda m sị, “Otu a ka Chineke ga-esi yọchapụ site nʼụlọ ha na ihe nweta ha onye ọbụla nke na-agaghị edebezu nkwa a.” Ndị niile zukọrọ kwere sị, “Amen.” Ha tokwara ONYENWE ANYị: Ha niile mekwara ihe ha kwere na nkwa. Ọzọ, nʼime afọ iri na abụọ ahụ a họpụtara m ị bụ onyeisi ọchịchị na Juda, site nʼiri afọ abụọ nke ịbụ eze Ataksekses ruo nʼafọ iri atọ na abụọ ya, mụ na ụmụnne m esiteghị na nri a na-atụkọrọ onyeisi ọchịchị were ihe oriri ọbụla. Ma ọ bụghị otu a ka o si dị na mbụ, nʼihi na ndịisi ọchịchị niile buru m ụzọ chịa boro ndị ahụ ibu arọ dị ukwuu. Ha na-anakọta site nʼaka onye ọbụla iri mkpụrụ ọlaọcha anọ, tinyere ihe oriri na mmanya ha na-ewebatakwa. Ọbụladị ndị na-enyere ha aka mekpakwara ndị mmadụ ahụ. Ma emeghị m otu a, nʼihi ịtụ egwu Chineke. Kama, anọgidesiri m ike nʼọrụ iwugharị mgbidi ahụ, achịkọtara ndị ikom m niile nʼebe ahụ nʼihi ije ozi a. Ọ dịghịkwa ala anyị zụrụ. Ma otu ọ dị, ndịisi Juu ọnụọgụgụ ha dị otu narị na iri na ise na-eri nri na tebul m, tinyere ndị na-abịakwute anyị site na mba ndị dị anyị gburugburu. Ihe na-ezu nri a na-eri nʼụlọ m kwa ụbọchị bụ otu ehi na atụrụ isii gbara abụba, na ọtụtụ ọkụkụ, na ụdị mmanya dị iche iche a na-ebubata kwa ụbọchị iri ọbụla. Nʼagbanyeghị nke a, ọ dịghị mgbe ọbụla m nara site nʼaka ha ụtụ ihe oriri nke onye na-achị ala kwesiri inweta, nʼihi na ha onwe ha nọ na mkpa dị ukwuu. Chineke m biko, echefula ihe m meere ndị a, gọzie m nʼụzọ nke gị.

NEHEMAIA 5:1-19 Bible Nso (IGBOB)

Oké iti-nkpu nke ndi-ayi na ndinyom-ha we di megide umu-nne-ha, bú ndi-Ju. N'ihi na ufọdu di ndi nāsi, Ayi onwe-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom, di ọtutu: kwe ka ayi nara ọka, ka ayi we rie ihe, we di ndu. Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile na ulo-ayi nile ka ayi nēdo n'ibé: kwe ka ayi nara ọka, n'ihi oké unwu a. Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ayi ewerewo ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile biri ego itu utu-ala eze. Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n'etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile. Iwem we di ọku nke-uku mb͕e m'nuru iti-nkpu-ha na okwu ndia. Obim we duam ọdu, mu na ndi amara aha-ha na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si ha, Ọmuru-nwa ka unu onwe-unu nānara, nwoke ọ bula n'aka nwa-nne-ya. M'we nwe nkpọkọta uku megide ha. M'we si ha, Ayi onwe-ayi ab͕aputawo umu-nne-ayi, bú ndi-Ju, ndi erenyere ndi mba ọzọ, dika aka-ayi ruru; ùnu onwe-unu gēre kwa umu-nne-unu, àgērenye kwa ayi ha? Ha we b͕a nkiti, ha ahughi kwa okwu ha gāza. M'we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n'egwu Chineke ka unu gējeghari, n'ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi? Ọzọ kwa, mu onwem na umu-nnem na ndi nējerem ozi nēbinye ha ego na ọka n'ọmuru-nwa. Biko, ka ayi rapu ọmuru-nwa nka. Biko, burunu uzọ nyeghachi ha ubi nile ha, na ubi-vine nile ha, na ubi-olive nile ha, na ulo nile ha, na otù uzọ n'ọgu uzọ ise nke ego, na nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, nke unu nānara ha n'ọmuru-nwa. Ha we si, Ayi gēnyeghachi ha, ayi agaghi-achọ kwa ihe n'aka ha; otú a ka ayi gēme, dika gi onwe-gi nēkwu. M'we kpọ ndi-nchu-àjà, me ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Arurupu-kwa-ram obi-uwem, si, Ka Chineke rurupu nwoke ọ bula otú a site n'ulo-ya, site kwa na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, bú onye nādighi-eme ka okwu a guzosie ike; ọbuná otú a ya bu ihe arurupuworo, nke tọb͕ọ-kwa-ra n'efu. Nkpọkọta ahu nile we si, Amen, ha we to Jehova. Ndi-ayi we me dika okwu a si di. Ọzọ, site n'ubọchi o nyerem iwu ibu onye nāchi ha n'ala Juda, site n'arọ nke-orú we rue arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Ataksakses, bú eze, nke ahu bu arọ iri na abua, mu onwem na umu-nnem erighi nri nke onye nāchi ala. Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n'achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n'ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n'ihi egwu Chineke. Ọzọ kwa, m'jisiri ike n'ije-ozi mb͕idi a, ọ dighi kwa ubi ayi zutara: ma achikọtawo ndi nile nējerem ozi n'ebe ahu ije ozi ahu. Ọzọ, ndi-Ju na ndi nọchiri anya eze, bú ọgụ ndikom asa na iri, nọ na table nkem, ha na ndi nābiakute ayi site na mba ndi di ayi buruburu. Ma ihe nke edoziworo bayere otù ubòchi bu otù ehi na aturu isi arọputara arọputa; edozi-kwa-ra umu-nnunu nyem, dozi kwa manya-vine nile ọ bula n'uba otù ub͕ò n'ubọchi iri: ma n'ihe a nile ọ dighi nri nke diri onye nāchi ala m'chọrọ, n'ihi na òfùfè ahu di arọ́ n'aru ndi nka. Chinekem, chetaram ihe nile nke m'meworo n'ihi ndi nka, imerem ezi ihe.