Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 4:6-14

NEHEMAIA 4:6-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere, anyị wuziri mgbidi ahụ ruo mgbe ha niile ruru ọkara nʼịdị elu ya, nʼihi na onye ọbụla wepụtara obi ya ịrụ ọrụ. Ma mgbe Sanbalat, Tobaya, ndị Arab, ndị Amọn na ndị Ashdọd nụrụ na ọrụ iwuzi mgbidi Jerusalem na-aga nʼihu, nụkwa na-emechichala ebe niile puru epu, iwe were ha nke ukwuu. Ha niile gbara izu ịchịrị ndị agha bịa imegide Jerusalem, ime ka ọgbaaghara dị nʼobodo ahụ. Ma anyị kpere ekpere nye Chineke, kwụbakwa ndị nche iguzogide ha ehihie na abalị. Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ. Ma nʼotu oge ahụ kwa, ndị iro anyị na-agba izu nʼakụkụ, na-achọ igbu anyị mgbe anyị na-eleghị anya ha maọbụ mara ka ọrụ ahụ kwụsị. Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.” Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị. Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.”