Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 2:9-20

NEHEMAIA 2:9-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m. Ma mgbe Sanbalat, onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka. E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ, eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba. Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa. Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere. Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee. Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu. Ndịisi obodo amaghị ebe m gara maọbụ ihe m na-eme, nʼihi na agwabeghị m onye Juu ọbụla ihe m bu nʼobi, maọbụ ndị nchụaja, maọbụ ndị a na-asọpụrụ, maọbụ ndị ọchịchị obodo, maọbụ onye ọzọ ọbụla ndị ga-arụ ọrụ ahụ. Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.” Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya. Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge. Ma mgbe Sanbalat, onye Horon, na Tobaya, onyeozi ndị Amọn, na Geshem onye Arab, nụrụ ya, ha kwara anyị emo sị, “Gịnị bụ ihe nke a unu na-eme? Ọ bụ eze ka unu na-enupu isi megide?” Ma azara m ha sị, “Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gara anyị nke ọma. Anyị onwe anyị bụ ndị ohu ya ga-amalite iwughachi mgbidi a, ma unu onwe unu, unu enweghị oke maọbụ ọnọdụ ziri ezi maọbụ ihe ncheta ọbụla nʼime Jerusalem.”

NEHEMAIA 2:9-20 Bible Nso (IGBOB)

M'we biakute ndi nāchi ala n'ofè osimiri, m'we nye ha akwukwọ-ozi eze. Ma eze zìri ndi-isi usu-ndi-agha na ndi-inyinya isom je. Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, o we di ha njọ nke-uku na madu abiawo ichọrọ umu Israel ọdi-nma. M'we bata Jerusalem, nọ n'ebe ahu ubọchi atọ. M'we bilie n'abali, mu onwem na ndikom ole-na-ole sorom; ma egosighm madu ọ bula ihe Chinekem nētiye n'obim imere Jerusalem: ọ dighi kwa anu-ulo di n'ebe m'nọ, ọ bu nání anu-ulo ahu nke m'nānọkwasi ya. M'we si n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n'abali, we rue n'iru isi-iyi dragon, ru kwa ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, we le mb͕idi Jerusalem nile anya, bú nke etipúsiri etipú, ọku eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile. M'we gabiga rue ọnu-uzọ-ama isi-iyi, ru kwa ọdọ-miri eze: ọ dighi kwa ebe anu-ulo nke di n'okpurum gāgabiga. M'we nārigo na miri-iyi n'abali, m'we nēle mb͕idi ahu anya; m'we chigharia, ba n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, we laghachi. Ma ndi nọchiri anya eze amaghi ebe m'jere, ma-ọbu ihe mu onwem nēme; egosighkwam ndi-Ju rue ub͕u a, egosighkwam ndi-nchu-àjà, egosighkwam ndi amara aha-ha, egosighkwam ndi nọchiri anya eze, egosighkwam ndi fọduru ndi nēje ozi ahu. M'we si ha, Unu onwe-unu nāhu ọnọdu ọjọ nke ayi onwe-ayi nọ nime ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, na esure-kwa-ra ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku: bianu ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu kwa ihe-ita-uta ọzọ. M'we gosi ha aka Chineke nke di nma n'arum; na okwu nile nke eze kwa nke ọ gwaram. Ha we si, Ka ayi bilie lua mb͕idi. Ha we me ka aka-ha di ike ime ezi ihe a. Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, na Geshem, bú onye Arebia, we nu ya, ha we chìa ayi ọchì, leda ayi anya, si, Gini bu ihe a nke unu onwe-unu nēme? ọ̀ bu eze ka unu nānupu isi imegide? M'we zaghachi ha okwu, si ha, Chineke nke elu-igwe, Ya onwe-ya gēme ka ihe gara ayi nke-ọma; ayi onwe-ayi, bú ndi-orù-Ya, gēbili kwa lua mb͕idi: ma unu enweghi òkè, ma-ọbu ọnọdu ziri ezi, ma-ọbu ihe-ncheta, nime Jerusalem.