NEHEMAIA 1:8-10
NEHEMAIA 1:8-10 Bible Nso (IGBOB)
Biko, cheta okwu ahu nke I nyere Moses, bú orù-Gi, n'iwu, si, Asi na unu onwe-unu emekpu emekpu, Mu onwem gēme ka unu b͕asa n'etiti ndi nile: ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu. Ma ndia bu orù-Gi na ndi-Gi, ndi I were ike uku Gi, were kwa aka-Gi di ike, b͕aputa.
NEHEMAIA 1:8-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche. Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’ “Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta.