MAK 9:33-50
MAK 9:33-50 Bible Nso (IGBOB)
Ha we bia rue Kapanaum: mb͕e Ọ nọ, n'ulo-ha O we jua ha, si, Gini ka unu nēkwurita n'uzọ? Ma ha kpuchiri ọnu-ha: n'ihi na ha nārurita uka n'uzọ onye ka ibe-ya n'etiti ha. Ọ we nọdu ala, kpọ ndi-ozi iri na abua ahu; O we si ha, Ọ buru na onye ọ bula nācho ka ọ buru onye-isi, ọ gābu onye-ikpe-azu n'etiti unu nile, na onye nējere unu nile ozi. O we kuru nwatakiri debe ya n'etiti ha: mb͕e O kusiri ya n'aka-Ya, Ọ si ha, Onye ọ bula nke gānara otù nime umu-ntakiri di otú a n'aham nke-ọma, ọ bu Mu onwem ka Ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma, ọ bughi Mu ka ọ nānara nke-ọma, kama ọ bu Onye ziterem. Jọn siri Ya, Onye-ozizí, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi: ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi. Ma Jisus siri, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke gālu ọlu di ike n'aham, nke gāpu kwa ikwujọm ọsọsọ. N'ihi na onye nādighi-emegide ayi diri ayi. N'ihi na onye ọ bula nke gēkuru otù iko miri nye unu ṅua, n'ihi na unu bu ndi nke Kraist, n'ezie asim unu, na ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli. Ọzọ, onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwerenu ka ọ ma n'ọnyà, ọ gāka ya nma ma ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, tubà ya n'oké osimiri. Ọzọ ọ buru na aka-gi eme gi ka i ma n'onyà, bipu ya: o di gi nma ibà na ndu n'ọlusi, kari inwe aka-gi abua ba n'ọku ala-mọ, n'ọku anyughi-anyu; ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu. Ọ buru kwa na ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya: ọ di gi nma ibà na ndu na ngwurọ, kari inwe ukwu-gi abua atubà gi n'ọku ala-mọ; ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu. Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, tupu ya: ọ di gi nma ibà n'ala-eze Chineke nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ; ebe ikpuru nke nēri ha nādighi-anwu, ọku anyughi kwa anyu. N'ihi na agēji ọku b͕a onye ọ bula nnú. Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.
MAK 9:33-50 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?” Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya. Ọ nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi.” Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha, “Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m.” Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.” Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị. Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya. “Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri. Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ A ga-eji ọkụ nụchaa onye ọbụla dị ka nnu. “Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ị ga-esi mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo.”