MAK 7:5-8
MAK 7:5-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebi nʼusoro omenaala ndị okenye. Karịa iji aka na-adịghị ọcha rie nri ha?” Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’ Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.”
MAK 7:5-8 Bible Nso (IGBOB)
Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we jua Ya, si, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējeghi ije dika ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe, ma ha nēri nri-ha n'aka ruru árú? Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n'isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha, Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ. Ma ha nēbirim isi ala n'efu, Nēzí ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha. Unu nārapu ihe Chineke nyere n'iwu, jide kwa ozizí madu nyere n'aka-unu idebe.