Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 5:1-43

MAK 5:1-43 Bible Nso (IGBOB)

Ha we bia rue ofè ọzọ nke oké osimiri ahu, n'ala ndi Gerasa. Mbe Ọ putasiri n'ub͕ọ, ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we si n'ebe anēlì ozu zute Ya, nwoke ahu nwere ebe-obibi-ya n'ebe ahu anēlì ozu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru ike ya ab͕u ọzọ, ọbuná ma ewere nkpọrọ; n'ihi na ewereri nkpọrọ-ukwu na nkpọrọ ke ya ọtutu mb͕e, o we nyajipusia nkpọrọ nile, kujisia nkpọrọ-ukwu nile: ọ dighi kwa onye ọ bula di ike imeju ya anya. Mb͕e nile, abali na ehihie, o nēti kwa nkpu, were kwa nkume nēyikasi onwe-ya, n'ebe anēlì ozu na n'ugwu. Mb͕e ọ huru Jisus n'ebe di anya, o we b͕a ọsọ, kpọ isi ala nye Ya; mb͕e o tisiri nkpu n'oké olu, o we si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? Ewerem Chineke b͕a Gi iyi, emekpalam aru. N'ihi na Ọ nāsi ya, Si nime nwoke a puta, gi mọ nādighi ọcha. O we jua ya, Òle aha-gi? Ọ si Ya, Aham bu Legion; n'ihi na ayi di ọtutu. Ọ we riọsie Ya ike ka Ọ ghara izipu ha n'ala ahu. Ma oké ìgwè ezì di n'ebe ahu na nso ugwu ahu nāta nri. Ha we riọ Ya, si, Ziga ayi nime ìgwè ezì ahu, ka ayi we ba nime ha. O we kwere ha. Ndi-mọ ahu nādighi ọcha we puta, je ba n'ìgwè ezì ahu: ìgwè ezì we nudà n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'oké osimiri, ha ruru dika nnù ise; miri we b͕ab͕ue ha. Ndi nāzù ha we b͕alaga, kọsa ya n'obodo ahu na n'ubi. Ha we bia ihu ihe ọ bu, bú nke emereri. Ha we biakute Jisus, le onye ahu ndi-mọ ọjọ ji ka ọ nọduru ala, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè, bú onye nwere legion ahu: ha we tua egwu. Ndi huru ya we kọrọ ha otú emere onye ahu ndi-mọ ọjọ ji, na okwu ìgwè ezì ahu. Ha we malite iriọ Ya ka Ọ pua n'ókè-ala-ha. Mb͕e Ọ nābà nime ub͕ọ, onye ahu ndi-mọ ọjọ jiri na mbu we riọ Ya ka ya na Ya biri. Ma O kweghi ya, kama Ọ si ya, La n'ulo-gi, lakuru ndi nke gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Onye-nwe-ayí meworo gi, na otú O mere gi ebere. O we je, malite ikwusa na Dekapọlis ihe Jisus mere ya, ka ha ra: o we ju madu nile anya. Mb͕e Jisus gasiri ọzọ n'ub͕ọ ahu n'ofè ọzọ, oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ: O we nọ n'usọ oké osimiri. Otù nime ndi-isi ulo-nzukọ, aha-ya bu Jeairọs, we bia; mb͕e ọ huru Ya, o we da n'ala n'ukwu-Ya, we riọsie Ya ike, si, Nwam nwanyi ntà nānwunyu anya: ariọm I ka I bia bikwasi ya aka-Gi abua, ka ewe zọputa ya, o we di ndu. O we so ya je; oké ìgwè madu we nēso Ya, ha nākpab͕u kwa Ya. Otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke hu-kwa-rari ọtutu ahuhu n'aka ọtutu dibia, mefusia ihe nile o nwere, ma ọ baghi ya urù ọ bula, kama ọ jọkaria ya njọ, ebe ọ nuru ihe nile banyere Jisus, o we bia n'azu Ya n'etiti ìgwè madu ahu, we metu uwe-Ya aka. N'ihi na ọ nāsi, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam. Ngwa ngwa isi ọbara-ya kọsia; o we mara n'aru-ya na emere ya ka aru di ya ike n'ajọ ọria ahu. Ngwa ngwa, ebe Jisus mazuru na ike nke nēsi nime Ya puta apuwori, O chigharia n'ìgwè madu ahu, we si, Ònye meturu uwem aka? Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, I huwo ìgwè madu a ka ha nākpab͕u Gi, I nāsi kwa, Ònye meturum aka? O we le anya gburugburu ka Ọ hu nwanyi nke mere ihe a. Ma nwanyi ahu, ebe ọ matara ihe emere ya-ri, ọ tua egwu, ma kwa jijiji, bia da n'iru Ya, gwa Ya ezi-okwu nile. Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, ha si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwanyi anwuruwo: gini mere i nēsob͕u Onye-ozizí a ọzọ kwa? Ma Jisus aṅaghi nti n'okwu anēkwu, Ọ si onye-isi ulo-nzukọ ahu, Atula egwu, kwere nání. O kweghi kwa onye ọ bula so Ya je, ma-ọbughi Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne Jemes. Ha we bia ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu; O we hu ùzù, na ọtutu madu ka ha nākwa ákwá nēti kwa nkpu nke-uku. Mb͕e Ọ batasiri, O we si ha, Gini mere unu nātu ùzù, nākwa kwa ákwá? nwatakiri ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura. Ha we chìa Ya ọchì. Ma mb͕e Ọ chupusiri ha nile, Ọ kuru nna nwatakiri ahu na nne-ya na ndi Ya na ha yikọ, we ba n'ebe nwatakiri ahu di. O we jide nwatakiri ahu n'aka, si ya, Talita kumi; nke bu, ma asugharia ya, Nwa-ab͕ọghọ ntà, asim i, Bilie. Ngwa ngwa nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie, jeghari kwa; n'ihi na ọ b͕ara arọ iri na abua. Ngwa ngwa ibobo we nwubiga ha nile ókè n'aru O we gwasie ha ike ka onye ọ bula ghara imara nka: O we si ka enye ya ihe-oriri.

MAK 5:1-43 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin. Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya. Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya. Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya. Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ. Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya. O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.” Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!” Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ.” Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ. Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, “Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha.” Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile. Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere. Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha. Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ. Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha. Dị ka ọ na-achọ ịbanye nʼime ụgbọ, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ bibu nʼime ya rịọrọ ya ka o soro ha. Ma Jisọs ekweghị, kama ọ sịrị ya, “Laa nʼụlọ, lakwuru ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Onyenwe anyị meere gị, na otu o si meere gị ebere.” Ya mere, o si nʼebe ahụ pụọ, malitekwa ịkọsa nʼime mpaghara Dekapọlịs ihe ọma Jisọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya. Mgbe Jisọs jiri ụgbọ mmiri gafee nʼakụkụ nke ọzọ, ọtụtụ igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu mgbe ọ nọ nʼakụkụ osimiri. Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, rịọsie ya arịrịọ ike sị, “Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ.” Ya mere, Jisọs soro ya gawa. Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya. Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ. Ebe ọ nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka. Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m.” Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya. Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?” Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, ‘Onye metụrụ uwe m aka?’  ” Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya. Ma nwanyị ahụ, ebe ọ matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile. Ọ sịrị ya, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị.” Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?” Ma ka ọ nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, “Atụla egwu, naanị kwere.” O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma ọ bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis. Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa. Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!” Ma ha chịrị ya ọchị. Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina. O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”). Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu. Ma ọ dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie.”