MAK 4:37-39
MAK 4:37-39 Bible Nso (IGBOB)
Oké ajọ ifufe we fe, ebili-miri we nāwubà n'ub͕o ahu, ya mere na miri nēju n'ub͕ọ ub͕u a. Ma Ya onwe-ya nọ n'isi ub͕ọ, nāraru ura n'elu ohiri-isi: ha we kpọte Ya, Si Ya, Onye-ozizí, Ò metughi Gi n'obi na ayi nāla n'iyì? O we teta, bara ifufe nba, si kwa oké osimiri, Di jū, kpuchie ọnu-gi. Ifufe we febìe, oké ndaju we di.
Kesaa
Gụọ MAK 4MAK 4:37-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?” Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.
Kesaa
Gụọ MAK 4