MAK 4:35-41
MAK 4:35-41 Bible Nso (IGBOB)
N'ubọchi ahu, mb͕e o ruru anyasi, O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọzọ. Ha we rapu ìgwè madu ahu, we kuru Ya, otú di, tiyere onwe-ha n'ub͕ọ ahu. Ub͕ọ ufọdu ọzọ di kwa nke nēso Ya. Oké ajọ ifufe we fe, ebili-miri we nāwubà n'ub͕o ahu, ya mere na miri nēju n'ub͕ọ ub͕u a. Ma Ya onwe-ya nọ n'isi ub͕ọ, nāraru ura n'elu ohiri-isi: ha we kpọte Ya, Si Ya, Onye-ozizí, Ò metughi Gi n'obi na ayi nāla n'iyì? O we teta, bara ifufe nba, si kwa oké osimiri, Di jū, kpuchie ọnu-gi. Ifufe we febìe, oké ndaju we di. O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ? ùnu akēnweghi okwukwe? Ha we tua oké egwu, sirita onwe-ha, Ònye bu kwa onye a, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?
MAK 4:35-41 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.” Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya. Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?” Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii. Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?” Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”