Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 4:1-20

MAK 4:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge ọzọ, ọ malitere izi ihe nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere nʼime ụgbọ nọdụ ala nʼime ya nʼelu mmiri ahụ, ma igwe mmadụ ahụ nọkwa nʼakụkụ osimiri ahụ. O bidoro i kuziri ha ọtụtụ ihe nʼilu, ma nʼozizi ya, ọ sịrị ha, “Geenụ ntị! Otu onye ọrụ ubi pụrụ gaa ịkụ mkpụrụ ya. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịara tụtụrịa ha. Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼala nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ngwangwa nʼihi na ala dị nʼebe ahụ emighị emi. Ma mgbe anwụ wara, ọ chagburu ha, ha kpọnwụọ nʼihi na ha enweghị mgbọrọgwụ. Mkpụrụ ndị ọzọ dara nʼetiti ogwu; ogwu ahụ tolitere kpagbuo ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ. Mkpụrụ ndị ọzọ nke dara nʼezi ala, puru, tolite, ma mịa mkpụrụ na mmụba iri atọ, iri isii, ọ bụladị otu narị.” Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị ozi iri na abụọ ahụ na ndị ọzọ nọ ya gburugburu jụrụ ya ajụjụ banyere ilu ahụ. Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu, nke mere na, “ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla, ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla, ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’   ” Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ? Ọgha mkpụrụ ahụ na-agha okwu Chineke. Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha. Ndị ọzọ dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼala nkume. Ha nụrụ okwu ahụ, were ọṅụ nabata ya nʼotu mgbe ahụ. Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha, ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ. Ndị nke ọzọkwa, dị ka mkpụrụ dara nʼetiti ogwu, nụrụ okwu ahụ; ma nchekasị nke ndụ a, na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. Ndị ọzọ, dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼezi ala, nụrụ okwu ahụ, nabata ya ma mịa mkpụrụ dị iri atọ, iri isii, maọbụ otu narị.”

MAK 4:1-20 Bible Nso (IGBOB)

Ọ we malite ọzọ izí ihe n'usọ oké osimiri. Oké ìgwè madu uku we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕o, we nọdu ala n'osimiri; ìgwè madu ahu nile we nọ n'usọ oké osimiri n'elu ala. O we zí ha ọtutu ihe n'ilu di iche iche, si ha n'ozizí-Ya, Nurunu: Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru: o rue, mb͕e ọ nāgha, ufọdu dara n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tuturie ha. Nkpuru ọzọ we da n'ala nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne; ngwa ngwa ha we pulite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi: ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu. Nkpuru ọzọ we da n'etiti ogwu, ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha, ha amighi kwa nkpuru. Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, nētó nāba kwa uba; ha we mia, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise. O we si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu. Mb͕e nání Ya nọ, ndi nọ Ya buruburu na ndikom iri na abua ahu we jua Ya ilu ahu. O we si ha, Ọ bu unu ka enyeworo ihe-omimi ala-eze Chineke: ma anēmere ndi nọ n'èzí ihe nile n'ilu: ka ha we hu n'ọhuhu, ghara ihuta; ka ha we nu kwa n'ọnunu, ghara inuta; ka ha ghara ichighari mb͕e ọ bula, ewe gb͕aghara ha. O we si ha, Ùnu amataghi ilu a? ùnu gēsi kwa aṅa mara ilum nile? Ọgha-nkpuru nāgha okwu Chineke. Ma ndia bu ndi nọ n'akuku uzọ ahu, ebe anāgha okwu ahu; ma mb͕e ọ bula ha nuru, ngwa ngwa Setan abia, we napu okwu nke aghaworo nime ha. Otú ahu, ndia bu kwa ndi anāgha n'ebe nkume ahu, ndi, mb͕e ọ bula ha nuru okwu ahu, ngwa ngwa ha were ọṅù jide ya; ma ha enweghi nkpọrọgwu nime onwe-ha, kama ha nānọ nwa oge; emesia, mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ha ma n'ọnyà. Ndi ọzọ bu kwa ndi anāgha n'etiti ogwu ahu; ndia bu ndi nuru okwu ahu, ma ncheb͕u nile nke oge a, na aghughọ nke àkù, na nbata nke agu ihe di iche iche ọzọ, nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru. Ndi ahu bu kwa ndi aghara n'ala ahu di nma; ndi ọ bula ndi nānu okwu ahu, we nara ya, we mia nkpuru, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.