MAK 2:21-22
MAK 2:21-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa. Ọ bụrụ na o mee nke a, akwa ọhụrụ ahụ ga-adọkapụ site na nke ochie mee ka ndọka ya dị njọ karịa. Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”
MAK 2:21-22 Bible Nso (IGBOB)
Ọ dighi onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu dukọta n'uwe ochie: eme otú a, nke kwesiri imechi ya nādọkapu ihe n'aru-ya, nke-ọhu nādọkapu n'aru nke-ochie, ndọka jọkariri njọ aputa. Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, manya-vine gāb͕awa karama-akpukpọ ahu, manya-vine na karama-akpukpọ ala kwa n'iyì: ma anāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu.