Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 2:13-28

MAK 2:13-28 Bible Nso (IGBOB)

O we pua ọzọ ga n'usọ oké osimiri; ìgwè madu ahu nile we nābiakute Ya, Ọ nēzí kwa ha ihe. Mb͕e Ọ nāga, Ọ hu Livai nwa Alfiọs, ka ọ nọduru n'ulọ-ùtú, Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya O rue, na Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, ọtutu ndi ọna-utu na ndi-nmehie so-kwa-ra Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri: n'ihi na ha di ọtutu, ha nēso kwa Ya. Mb͕e ndi-ode-akwukwọ di n'etiti ndi-Farisi huru na O nēso ndi-nmehie na ndi-ọna-utu ahu eri ihe, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, Gini mere Ọ nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ahu eri ihe? Mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma: abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie. Ndi nēso uzọ Jọn na ndi-Farisi nēbu kwa ọnu: ha we bia, si Ya, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ Jọn na ndi nēso uzọ ndi-Farisi nebu ọnu, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu? Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru ibū ọnu mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ka oge ra ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ ha apughi ibū ọnu. Ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ohu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu n'ubọchi ahu. Ọ dighi onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu dukọta n'uwe ochie: eme otú a, nke kwesiri imechi ya nādọkapu ihe n'aru-ya, nke-ọhu nādọkapu n'aru nke-ochie, ndọka jọkariri njọ aputa. Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, manya-vine gāb͕awa karama-akpukpọ ahu, manya-vine na karama-akpukpọ ala kwa n'iyì: ma anāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu. O rue, na Ọ nāga n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we malite ighọ oko ọka mb͕e ha nāga. Ndi-Farisi we si Ya, Le, gini mere ha nēme n'ubọchi-izu-ike ihe nēzighi ezi n'iwu? O we si ha, Ọ dighi mb͕e ọ bula unu guru ihe Devid mere, mb͕e ọ nọ na nkpà, mb͕e agu gu-kwa-ra ya, ya onwe-ya, na ndi soro ya? Otú ọ batara n'ulo Chineke mb͕e Abaiata bu onye-isi-nchu-àjà, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka erie, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ? O we si ha, Emere ubọchi-izu-ike n'ihi madu, emeghi madu n'ihi ubọchi-izu-ike: ya mere Nwa nke madu ji buru kwa Onye-nwe ubọchi-izu-ike.

MAK 2:13-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Emesịa, Jisọs pụrụ gaa nʼakụkụ osimiri ahụ. Igwe mmadụ bịakwutere ya. Ọ malitere izi ha ihe. Mgbe ọ na-aga nʼihu, ọ hụrụ Livayị nwa Alfiọs ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m,” o biliri sooro ya. Mgbe ọ na-eri nri uhuruchi nʼụlọ Livayị, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ, nʼihi na ndị na-esogharị ya dị ọtụtụ. Mgbe ndị ozizi iwu nke ndị Farisii hụrụ ya ka o so ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere o ji eso ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-erikọ nri?” Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị ha, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume kama ndị mmehie.” Nʼoge a, ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ. Ndị mmadụ bịara jụọ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị nke gị adịghị ebu ọnụ?” Jisọs sịrị ha, “O kwesiri na ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwunye ga-ebu ọnụ mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ nʼetiti ha? Ha apụghị ibu ọnụ ogologo oge ya na ha nọ. Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Nʼụbọchị ahụ ka ha ga-ebu ọnụ. “Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa. Ọ bụrụ na o mee nke a, akwa ọhụrụ ahụ ga-adọkapụ site na nke ochie mee ka ndọka ya dị njọ karịa. Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.” Otu ụbọchị izuike, ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Dị ka ha na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ụfọdụ ogbe ọka nʼime ọka ndị ahụ. Ndị Farisii siri ya, “Lee, gịnị mere ha ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike.” Ma ọ sịrị ha, “Unu agụtaghị ihe Devid na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha? Nʼoge Abịata bụ onyeisi nchụaja, ọ banyere nʼụlọ Chineke taa achịcha e chere nʼihu ya, nke ziri ezi na ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesiri ịta ya. O nyetụkwara ndị ya na ha so.” Mgbe ahụ, ọ gwakwara ha sị, “E mere ụbọchị izuike maka mmadụ, emeghị mmadụ maka ụbọchị izuike.” Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị izuike.