MAK 2:1-5
MAK 2:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ụbọchị ole na ole gafesịrị, ọ bataghachiri na Kapanọm. Ndị mmadụ nụrụ na ọ lọghachila. Igwe mmadụ zukọtara nʼime ụlọ ahụ nke mere na ohere afọdụghị ọ bụladị nʼọnụ ụzọ. O kwusakwaara ha oziọma. Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya. Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị.”
MAK 2:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Ọ batara ọzọ na Kapanaum mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, ewe nu na Ọ nọ nime ulo. Otutu madu we zukọ, nke mere na uzọ adighi ọzọ, é-è, ọbuná n'ọnu-uzọ: Ọ nāgwa kwa ha okwu Chineke. Ha we bia, kutara Ya otù onye akuku-aru-ya nwuru anwu, nke madu anọ nēbu. Mb͕e ha apughi ikuru ya biakute Ya n'ihi ìgwè madu, ha we kpupu elu ulo ebe Ọ nọ: mb͕e ha gwupusiri ya, ha we buda ute nke onye akuku-aru-ya nwuru anwu nēdina. Mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.