MAK 14:32-36
MAK 14:32-36 Bible Nso (IGBOB)
Ha we biarue ogige nke aha-ya bu Getsemane: O we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'nēkpe ekpere. O we kuru Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, ibobo we malite inwu Ya n'aru nke-uku, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri. O we si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, nēche-kwa-nu nche. O we ga n'iru nke-ntà, da n'ala, we kpe ekpere ka oge hour ahu we gabiga Ya, ma ọ buru na ọ gēkwe me. O we si, Aba, Nna, I puru ime ihe nile; naram iko a: ma ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Gi onwe-gi nāchọ.
MAK 14:32-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.” Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri. Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.” Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya. O kwuru sị, “Abba, Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”